Fake News: Ugboro ise akụkọ ụgha kpọtụrụ n'Ala Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị bụ akukọ ụgha (fake news)?
Ajụjụ a bụ ihe ọbụrụ na a jụrụ ya mmadụ ihe dịka afọ isii gara aga, o mee ngwa ngwa kwuo na ọ bụ akụkọ ụgha, ma maa atụ ụdịrị akụko a.
Mana ugbua, n'agbanyeghị na ihe bụ akukọ ụgha agbanwebeghị, atụ ya abụghịzị etu ọ dị na mbụ.
Ugbua, ọtụtụ mmadụ amaghịzị nke bụ eziokwu, maọbụ nke bụ asị.
BBC gbara mbọ dee etu a ga-eji mata nke bụ akụko ụgha. Gụọ maka ya ebe a: "Etu akụkọ ụgha si akwanye ọku n'ọgbaghara ọchịehi".
N'azụ nke ahu, lee ugboro ise akụkọ ụgha wuru ọfụma n'ala Igbo:
1) Jubril nke Sudan
Ihe na-ewu n'Igbo ugbua bụ na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari abụrụla onye lara mmụọ.
Akụkọ a, nke malitere n'ọnụ Nnamdị Kanu, bụ onyeisi ndị a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), kwuru na Buhari nwụrụ n'afọ 2017.
O kwukwara na a gara mba Sudan kpọta otu nwoke a kpọrọ Jubril, kpọrọ ya gaa mba ofesi, megharịa ihu ya na agwa ya.
N'ọnụ Kanu na ndị na-akwado ya, "Onye nọ n'Aso Rock abụghị Buhari."
Femi Fani-Kayode, bụbụ minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, sokwa agbasa akụkọ a:
2) "Monkey Pox"
N'afọ 2017, ndịagha Naịjirịa gara obodo Ozubulu ime ihe ha kpọrọ "medical outreach" na Bekee.
Ka ha nọ ebe ha na-eme emume ahụ, mkpu bidoro dawa n'Ọnịcha, Enugwu, Owere, Pọtakọt, na ọtụtụ obodo ndị ọzọ.
Mkpu a butere ajọ ọsọ makana akụkọ ụgha kwuru na ndịagha na-aga ụlọakwụkwọ agba ụmụaka ọgwụ n'ike.
Akụkọ ụgha a sitere n'akara Facebook ndị Radio Biafra.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
3) Ndịagha Naịjirịa ji Nnamdi Kanu n'ime ụgbọmmiri
Femi Fani-Kayode, bụ onye aha ya pụtara n'elu maka akukọ ụgha a, sokwa sunye ọkụ n'akụkọ kwuru na Nnamdi Kanu nọ n'aka ndịagha Naịjirịa n'ime ụgbọmmiri dị n'osimili.
Akụkọ a wuru ewu, mana asị ọ bụ gbara n'anwụ mgbe Kanu pụtara ma kọọ etu o si gbapụ na be ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
4) Davido na Chioma
N'ọnwa Ọktoba nke afọ a, The Cable, bụ ụlọ ntaakụkọ na-agbasa ozi n'ịntanet, dere na otiegwu a ma ama aha ya bụ Davido na nwaada ya na ya na ayị a kpọrọ Chioma, agbasaala.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ka nke a ka na-akpọtụ, Davido gara na Twitter dee na nke a bụ asị.
5) Naịjirịa ga-aba Israel ọgụ maka Kanu
Ka akụkọ na Nnamdi Kanu apụtala ihe n'Izrel ruru Naịjirịa, akukọ pụtara na Lai Mohammed, bụ minista na-ahụ maka mgbasaozi, kwere nkwa na Naịjirịa ga-ebuso Izrel agha maka ya.
Lai Mohammed mechara jiri akụkọ a mee akaja makana ọ sị na onweghi mgbe o kwuru ụdịrị okwu a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọtụmatụ ụdịrị akụkọ a karịrị, makana akụkọ ụgha ewerela oche n'obodo.









