Etu akụkọ asị si akwanye ọku na ọgbaghara ọchịehi

Foto adigboroja a na-eke na soshal midia nke ndị mmadụ na-ekwu na ọ na-egosi ọgbaghara dị n'etiti obodo abụọ na-akwanye ọkụ na nsogbu di na Naịjirịa.
O ruola abalị atọ esi na nnukwu ọgbaghara dara n'etiti ndị ọchịehi bụ ndị alakụba na ndị ọrụugbo bụkarị ndị otu Kristi nke tara isi ihe ruru mmadụ 200 n'etiti Naịjirịa.
Foto a na-egosi nwaanyị kpudoro ihu n'ala ọbara si n'ukombu ya agbapụta bụ onye a sị osi ya bụ ọgbaghara Jọs pụta.
Nde kwuru nde mmadu kekọrịtara foto a na Twitter, mana o bu ụzọ pụta na intanet n'afọ 2011 na akukọ banyere ọgụ ezinaụlọ na Naijirịa.
Foto ọzọ dị ka ọ na-egosi mmadụ isii egburu na mwakpo etiti Naịjirịa.

Ebe foto si, AFP
Mana, eleruo ya anya, ahụ na foto a abụghị na Naịjirịa ka o si, kama ọ bụ foto esetere na ihe mberege okoroụzọ mere n'afọ 2015 na Dominican Republic.
Foto abụọ abụghị ihe anyi nwereike itenye ebe a maka na ha na-ama akpata oyi, ma nwekwa ọtụtụ okwu nwere ike ibute ọgbaghara so ha.
Ọbụghị soso foto ndị a.
Na mbido izuuka, ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi na Naịjirịa aha ha na-ada ụda dere akụkọ na Danladi Ciroma, bụ otu onye n'ime ndị isi otu Miyetti Allah, si na mwakpo emere na Platu bụ mmekwụta maka ehi 300 egburu.
E kwuru na Ciroma sị: "Maka na ahughị ehi ndị a, ka onyeọbula enwekwala nchekwube na udo ga-adị ebe a."
Okwu a were ndi mmadụ ezibote iwe, mana Ciroma kwuru na onweghi mgbe ya kwuru ụdịri okwu a.

Gini bụ akụkọ ụgha?
- Akukọ enweghi isi na ọdụ, foto maọbụ ihe nkiri emere iji kesa ọgbaghara maọbụ akuko asị
- Ozi, foto maọbụ ihe nkiri emegharịrị iji ghọgbuo mmadu - maọbu foto ochie ekere ka nke ọhụrụ
- Ihe egwuregwu eji akuko me abụghi iji ghọgbuo mmadụ nwere ike ime otu a

Akụko asi abughị ihe ọhụru na Naịjirịa, ọkachasị nke metụtara ọgbaghara dị n'etiti agbụrụ na agbụrụ.
N'ụfọdụ oge, ya bụrụ na-enweghị ozi sitere na aka ndị gọọmentị maọbu ndi na-achị, okwu asi enweta ohere nọchịe eziokwu. Ihe na-enye aka ịgbasa ọgbaghara.
Ntisa soshal midia - Naịjirịa nwere mmadụ nde 26 na Facebook sọsọ - nakwa etu ekwenti ọgba ọhụru jiri na-eru ọtụtụ mmadụ aka mere ka asi na-agbasa ọsịsọ na soshal midia.
Na Janụwarị, gọọmentị Naịjirịa, katọrọ nwakpo ndị ọchịehi na-eme na Benue steeti, bụ nke were ndị mmadụ iwe.
Ka otu ọnwa gachara nke a mere, ozi ezipụrụ eji agbaara ọha ama maka ihe yiri mwakpo ndị ọchịehi n'ụzọ Ibadan na Legọs -- bụ ụzọ dị mkpa na ọdịda anyanwụ nke ndida Naịjirịa -- wuru ewu ọfụma tupu uweojii katọ ya na ọ bụ asị.

Read more:

Ka nkatọ ndị mmadu na akatọ gọọmentị Naịjirịọa maka etu ha si etinye anya n'ọgbaghara na amụbanwanye, a na-atụ ụjọ na akukọ ụgha nwereike ibute ọgbaghara ọhụrụ.
N'afọ gara aga, Minista Mgasaozi bu Lai Mohammed kwuru maka ihe egwu na-eso akụkọ asi, ma dọọ aka na ntị na onwereike ghasaa mba.
Etu esi amata akuko ụgha
Okwu ọgbaghara dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo ka nwere ike ibute ọtụtụ akụkọ asi ka a na-akwado ntulika nke afọ na-abịa. Ụlọ soshal midia, dika Facebook na Twitter, ewepụtala atumatu ha chọrọ iji lụsa ihe a bụ nsogbu na ụwa niile ọgụ, mana lee ụzọ ise ị ga-eji nye aka kwụsị nkekọrịta akụkọ asi:
- Nyocha ebe o si: Akara akụkọ asi na soshal midia na-agbalị ka ha pụta ka ha abụ ndị ọma, ọ di mkpa inyocha ma akara niile isi ezipụ ozi ha bụ nke ọma. Na TWITTER, facebook na Instagram, ndị ọma na-enwe akara eji ama ha.
- Lee ọtụtụ akara mgbasa ozi: Agbanyeghi na nke a nwereike ilafu mmadụ, ọ bu ihe ziriezi etinye anya na akara mgbasa ozi di icheiche. Nyocha ma ụlọọrụ ntaakụkọ ama ama ọ na-agbasa ozi dị etu a.
- Ihe eji eme nchọpụta: Enwere ọtụtụ ihe eji eme nchọpụta dị na intanet e nwere ike ji nyocha ozi na-eru gị aka. Google, Bing na Tin Eye na enye aka chọpụta ebe foto si site na ihe Bekee kpọrọ "reverse image" nke na-enye aka ịchọpụta ebe foto si, na-ebe ọpụtara mbụ.
- Nyocha metadata: Ya bụrụ na i nwere ihe nkiri maọbụ foto, enwere ike nyocha ihe akpọrọ metadata ga-enye gị ozi gbasara ya. Ọkachasị ebe esere foto ahụ na "kamera" eji see ya. Mana, mgbe entinyere foto na ihe nkiri na intanet, ihe a niile na ehichapụ.
- Che ya tupu etinye ya: Nke a dị ka ihe mmadụ ncha ma, mana kpachara anya gị maka inye aka n'ibusa akukọ asi. Jụọ onwe gi ma ihe i chọrọ itinye ọ bu eziokwu, tupu ị pịa "enter".









