Plateau: Ndị ọchịehi gburu mmadụ 25 na mwakpo ọhụrụ na Plateau

Ebe foto si, AFP
Ndị e chere na ha bụ ndị ọchị ehi egbuola ihe ruru mmadu iri abụọ n'ise na Plateau steeti na mpaghara ugwu Naịjiria.
Ọnọọgụgụ na-ekwu na ndị nwụrụ n'ihe a bụ nwoke iri n'itoolu, ụmụnwaanyị atọ na ụmụaka atọ na ebe ahụ.
Onye na-ekwuchitere ndị uweoji ọnụ bụ Matthias Terna sị na ndị malietere ị gba egbe ma ị gbakwa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'abalị ụnyaahụ.
Matthias sị kwa na ọ bụ n'obodo Dundu na Kwall ebe Plateau steeti na Kaduna steeti nwere oke ala ka ihe a mere.
Onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nchekwa achọghị ka akpọ aha ya sị na anyị kwesiri iji aka ike soro ndị mwakpo a.
Ọ sị na ọbụ ihe mwute na ihe a mere n'ọtụtụ ụbọchị gara ebe Buhari gara i leta ndị ụdị mwakpo a metụtara mbụ.
Onye ọkachamara ahụ gwakwara BBC n'ihe a gosiri n'uche onyeisiala Buhari adịghị n'ihe na-eme n'ala.
Matthias bụ onye na-ekwuru ndị uweoji sị na o nwere atụmatụ ndị agha na-eme n'obodo Plateau steeti a na-akpọ 'Operation Safe Haven' n'asụsụ bekee
Ọ sị naọbụ ndị agha na ndị uweoji jịkọrọ aka na-emepụta atụmatụ a.
Terna ji kwa ohere a na-ekwu na ha kwesiri ị nweta ndị mmadụ ọzọ ga-enyere ha aka gbochie ụdị mwakpo a ime ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










