Nsogbu anyị na-ahụ n'ụzọ - Nwaanyị na-akpa ndị ọkwọ ụgbọala obi ụtọ
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Josephine Okeme bụ nwaanyị uweojii na-atụziri ụgbọala n'okporoụzọ.
Ọ kọwara etu ndi na-anya Danfo na ndị ọzọ ji enye ya nsogbu n'ọrụ.
Okeme ji ọkwa ASP n'ọrụ uweojii, kwuru na ndị Keke na ndị ọgbatumtum so kwa na ndị na-enye ya nsogbu.
Ọ gara n'ihu nye ndị ụgbọala ndụmọdụ ka ha na-erubeisi n'iwu nakwa ọkụ na-achị okporoụzọ.
Okeme gwara ndị na-akwọ ụgbọala ka ha ghara ị na-anya warawara wara n'ụzọ.
Ọzọ okwuru bụ na ndị mmadụ na-akwado ya ọfụma, nke a na enye ya ọṅụ, na ikike ịrụ ọrụ ya ọfụma.