Oke ọkụ latrik emebiela igwe okwu n'ụlọomeiwu nta

Akụkọ dị mkpa:

Ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, @HouseNGR

Ndị ụlọomeiwu nta arụghị ọrụ taa makana igwe okwu ha a zụrụ kemgbe afọ 1999 arụghị ọrụ.

Onyeisi ha bụ Yakubu Dogara kọwara na ọ bụ oke ọkụ latrik mebiri igwe okwu ahụ

Ekweremadu ekweteghị na nchọpụta ndị uweojii

Ike Ekweremadu.

Ebe foto si, Getty Images

Ndị gọvanọ sị mpaghara ọwụwa anyawụ ekwola na ha ekweghị n'ihe ndị uweojii kpebiri na ọ bụ ndị ohi wakporo be Ike Ekweremadu.

Ekweramadu n'onwe ya sị na ọ ga-agbasa ihe nkiri gosiri oge ndị a batara be ya, ịji gosi na ndị a bụ ndị chọrọ igbu ya.

Ụkọchukwu Obinna agbahariala Okorocha

Okorocha

Ebe foto si, Getty Images

Ụkọchukwu Anthony Obinna bụ aka na-achị ndị ụka katolik n'Owere agwala BBC Igbo na onweghị esemokwu dị n'etiti ya na gọvanọ Rochas Okorocha.

Obinna kọwara na ihe butere iwe bụ makana ya chọrọ ka ndị Imo nwee ọchịchị nke ga-amịpụta mkpụrụ.

N'Afrika

Ndị ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Reuters

N'Afrika, ndị omekome atọhapula ndị ụmụakwụkwọ ahụ sị mba Cameroon ha tọrọ n'ụbọchị ole n'ole garaga.

Akụkọ na-erute BBC ntị bụ na atọhapụrụ ha taa na nkiti.

Jose Mourinho

Jose Mourinho

Ebe foto si, Reuters

N'egwuregwu bọọlụ, otu FA ekwuola na ha ga-arịọ ka ha kpegharịa mkpebi kwuru na onweghị nha ha ga-ada Jose Mourinho maka okwu ọjọ o kwuru na ngwụcha asọmpị Man U na Newcastle gbara ụnyahụ.

Mwakpo ụlọ Ike Ekweremadu

Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

Nkọwa foto, Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata

Ndị uweojii ekwuola na mwakpo mere n'ụlọ osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu bụ naanị maka izu ya ohi na ọ bụghị igbu ya na ezinaụlọ ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Jimoh Moshood kwuru na ahụrụ ngwaọrụ eji akpaka ụzọ n'aka onye anwụchiri mere nke a mana nyocha ka na-aga n'ihu.

Uweojii kwuru na ndị mere nke a bụ onye akpọrọ Mohammed Yusuf si na Zamfara Steeti nọ n'aka ndị uweojii ugbua nakwa onye akpọrọ Ali gbara ọsọ.

Yusuf wepụtara onwe ya kọwara ndịuweojii na ọ bụ ya na Ali so kpaa mkpakpa ahụ.

NLC chọrọ iwu ụgwọ Opekatampe

Ndị otu NLC

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, NLC bụ otu jikọtara ndị ọrụ niile na Naịjirịa

Otu jịkọtara ndị ọrụ ekwuola na iwu ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ ga-adịnwu ire n'ime izuụka abụọ ma ọ bụrụ na onyeisiala zigara ya ndị ụlọomeiwu n'izuụka a.

Onyeisi aha bụ Ayuba Wabba kwuru na ezi mmekọrịta dị n'etiti ha na ndị ụlọomeiwu ga-eme ka nke a dị ire.

N'Ofesi

Alexandria Ocasio-Cortez bụ onye Democrat nwetere mmeri na ntuliaka

Ebe foto si, Reuters

Ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Democrats ekpokọrọla ọkwa ọchịchị n'ụlọ nnọchite anya nke mba Amerịka n'ime ntuliaka ha mere.

Ụdị mmerie a bụ nke ha na-enweta n'ime afọ asatọ ga-eme ka ha gbanwe ụfọdụ ebunobi onyeisiala bụ Donald Trump.

N'egwuregwu

Malcom nyere goolu n'asọmpi Barcelona na Inter Milan

Ebe foto si, Huw Evans picture agency

Barcelona abụrụla otu bọọlụ mbụ ga-aba n'agba nke iri isii n'asọmpi Uefa Champions.

Ebe Liverpool tara ọkpụ goolu abụọ n'aka Red Star Belgarde na asataghị otu, n'otu aka ahụ agbara Monaco ọkpụ goolu anọ chara acha.

Ihe nkiri

Aha onyonyo, ndị ishi na-agụ egwu