NLC strike: Ndị ọrụ agaghị eme abụbọ ọrụ ọzọ

NLC

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, NLC chọrọ ka gọọmentị na-akwụ N30,000 dịka ụgwọ ọnwa nke kachasị obere

NLC bụ Nigeria Labour Congress ekwuola na agaghị eme abụbọ ọrụ dịka ha sịrị kwuo na ha ga-eme.

Cheta na abụbọ ọrụ a kwesiri ịbido taa bụ ụbọchị 6 Nuvemba, 2018.

Onyeisi otu a bụ Ayuba Wabba kwuru na a mere nkpebi a na ngwụcha ọgbakọ otu ha na ndị gọọmentị mere n'abalị ụnyahụ bụ Nụvemba 5.

Wabba kọwara n'ime ọgbakọ a, gọọmentị binyere aka n'akwụkwọ gbasara ego ọnwa ọhụrụ nke ha kwetara na ha ga na-akwụ ndị ọrụ.

Mana Wabba ekwuputeghi ego ole bụ ụgwọ ọhụrụ a.

Akụkọ na-ekwu na kọmitee ọhụrụ gọọmentị mụptara maka ịleba anya n'okwu emeela mkpebi gbasara ego ole ga-abụ ụgwụọ ọnwa kachasị obere na Naijiria.

Kepu kepu na-ekwu na onyeisiala Buhari ga-ekwupute ole bụ ụgwọ ọhụrụ a taa bụ Nuvemba 6, 2018.

BBC Igbo ga-ebute akụkọ a ngwa ngwa ka ọ sị erute anyị ntị.