Kwụọnụ ndị ụlọomeiwu Imo N8m - Anunihu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa taa

Ụlọomeiwu Imo steeti

Rochas Okorocha na Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Rochas Okorocha na ndị pati ya bụ APC na enwe ọgbaghara n'Imo steeti

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ụlọikpe akagbuola nkwụsị ọrụ n'ike a kwụsịrị mmadụ ise nọ n'ụlọomeiwu nke Imo steeti, ma kwuo ka ha laghachị ọrụ ozugbo.

Ọkaikpe Goddy Anunihu kwukwara ka a kwụọ mmadụ atọ n'ime ha nde asatọ.

Ndị omeiwu ihe a metụtara bụ Chiji Collins, Nkenna Nzerue, Uche Oguwuike, Israel Nnataraonye nakwa Donatus Onuigwe.

Cheta na mmadụ ise a kpụpụrụ Gọvanọ Rochas Okorocha na Acho Ihim bụ onyeisi ụlọomeiwu nke Imo steeti, ụlọikpe n'ọnwa Julaị gara aga, ka a kwụsịrị ha ọrụ n'ihi ihe a kpọrọ akpaghị agwa kwesịrị onye omeiwu, nke Bekee kpọrọ "un-parliamentary conduct".

N'akụkọ ọzọ,

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC, ekwuola na ọ bụ naanị ndị na-efe ala nna ha otu afọ, ụmụakwụkwọ mahadum gọomentị etiti nakwa ndị ọrụ bekee na-arụ na ngalaba gọomentị etiti ha ga-eji aka ha họrọ, ka ha ga-eji duzie ntuliaka 2019.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Na mba ofesi,

Ndị ntọ mmadụ tọrọla ihe karịrị mmadụ iri asatọ gụnyere ụmụakwụkwọ Presbyterian sekọndarị n'obodo Bamenda dị na Kameroon taa.

Ndị ụlọụka Presbyterian nwe ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na ọ bụ ndị chọrọ iji aka ha achị onwe ha Bekee kpọrọ Separatists, tọrọla ha.

BBC Pidgin nwetara ihe nkiri gosiri ka a nwụbara ụmụaka ahụ n'ime otu klaasị.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

N'egwuregwu,

Aka na-echere Naịjirịa bọolụ bụ Francis Uzoho, agaghị eso ndị otu ya gbaa asọmpi dị n'etiti Naịjirịa na Saụt Afrịka ụbọchị 17 nke ọnwa Novemba, 2018.

Uzoho kwuru na o nwetara mmerụ ahụ ga-eme ka ọ ghara isonye n'egwu ruo mgbe izu anọ gachara.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ka ndị Imo steeti chere aka ịghọrọ onye ga-efe ọkọrọtọ APC na 2019, FCC Jones Onwuasoanya bụ ọnụ na-ekwuchitere APC n'imo steeti kpọkuru ndị niile zọrọ ọkwa n'aha pati ha ka ha bịkọta ọnụ.

Aha onyonyo, Imo APC primaries: 'Pati ka a na-atụrụ vootu ọbụghị mmadụ'