Oby Ezekwesili ejirila ụkpa ekele malite ịchụ nta vootu ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezekwesili bidoro otu #BBOG iji gbapụta ụmụaka Chibok

Oby Ezekwesili ọ ga-azọtanwu ọkwa onyeisiala? O ji inye ụkpa ekele n'ụlọụka bido usoro ngagharị n'ime obodo nke Bekee kpọrọ "campaign" ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe onyeisiala Muhammadu Buhari ga-amalite campaign nke ya n'ime Aso Villa dị n'Abuja, dịka Inec si nye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ohere imalite ya.

Moghaluonweela osote?

Akụkọ na-eru anyị ntị site n'akwụkwọ ozi Guardian na-ekwu na Kingsley Moghalu na-azọ ọkwa onyeisiala ahọpụtala Oriakụ Umma Getso dịka osote ya ka ha na-azọ ndọrọndọrọ n'okpuru pati ya bụ Young Progressives Party.

Na mba ofesi,

Ihe merụrụ ahụ na ngagharịiwe ndị mba Frans malitere ime n'izu a eruola mmadụ narị anọ.

Ndị na-eme ngagharịiwe na Frans

Ebe foto si, AFP

Cheta na ọtụtụ mmadụ ruru puku narị abụọ na iri asatọ pụtara ime ngagharịiwe maka mbuli mmanụ ụgbọala gọomentị ha na-akwado ime.

N'egwuregwu,

Enweghị ebe otu Tanzania nke Emmanuel Amuneke na-achịkọta, ji azụ aga ka ha na-achụ isonye Iko Mba Afrịka makana Lesotho meriri ha.

Saụt Afrịka merikwara otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ "Super Falcons" n'egwuregwu nke mbụ ha na-agba n'asọmpi AWCON bụ Iko Mba Afrịka nke ụmụnwaanyị.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ha ga-ezute otu Zambia n'egwuregwu ọzọ ha ga-agba.

Ebe Ịngland ji ọkpụ goolu abụọ merie Kroeshia n'asọmpi UEFA nations League.

Osinbajo

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ụlọomeiwu ukwu ekwuola na ha nwere ike ịmalitere kọmịtii ga-enyocha osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo n'ihe gbasara ego Naịjirịa ruru ijeri naira iri atọ na atọ e tinyere aka maka ọrụ gbatagbata n'ọwụwa anyanwụ ugwu Naijiria.

Mana Osinbajo na-ekwu na o nweghị njọ ya mere maka na ego ahu bụ ego enyemaka ga-akwado ndị bi n'Ugwu.

Ihe mberede ụgbọala egbuola mmadụ na Ebonyi

Ihe mberede ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images

N'Ebonyi mmadụ ise anwụọla na ihe mberede ụgbọala mere n'Akpoha n'okporoụzọ Afikpo na Abakaliki.

Cheta na mmadụ abụọ ọzọ nwụrụ n'ụbọchị ole na ole garaga n'okporoụzọ ahụ.

WHO agbaala ọsọ ndụ na Kongo

Onye ọrụ WHO

Ebe foto si, Getty Images

Otu World Health Organisation esepụla aka enyemaka n'ịkwụsị ọrịa Ebola na mba Kongo dịka ha kpọpụtara ndị ọrụ ha na mba ahụ maka nnukwu agha na-ada n'ala ahụ ugbua.

Trump agaala ebe ọkụ na-agba na Kalifonia

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi, onyeisiala Amerika bụ Donald Trump agaala obodo Kalifonia ebe nnukwu ọkụ legburu mmadụ iri asa na isi ma repịa ọtụtụ ụlọ.

O kwuru na ọkụ mberede a bụ nke kachasị njọ n'ala ahụ .

Lee ndị na-azọ ọkwa ọkachaagba bọọlụ Afịrịka

Medhi Benatia (Morocco), Kalidou Koulibaly (Senegal), Sadio Mane (Senegal), Thomas Partey (Ghana) and Mohamed Salah (Egypt)

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Medhi Benatia, Kalidou Koulibaly, Sadio Mane, Thomas Partey na Mohamed Salah (site n'aka ekpe rue n'aka nri) bụ ndị a họpụtara.

N'egwuregwu, Medhi Benatia, Kalidou Koulibaly, Sadio Mane, Thomas Partey na Mohamed Salah bụ ndị ga-azọ ọkwa ọkacha agba bọọlụ n'Afrịka n'ime afọ na nturuugo nke ụlọọrụ BBC wepụtara.

Cheta na ọ bụ Salah bụ onye nwetara nzerea n'afọ gara aga.

Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị :

Aha onyonyo, Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a