Alvan Ikoku: Ihe ise ị kwesịrị iji cheta ya

Ebe foto si, Banknotes.com
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba 2019, ga-eme ya afọ 48 Alvan Ikoku nwụrụ, mana kedụ ihe ị ma maka ya?
Alvan Ikoku so na ndị Igbo ji eme ọnụ, ya bụ ndị ọ ga-abụ akpọwa aha ndị Igbo bụ isi a hụrụ kwaba okpu ghara ịkpọ aha ya, a mara na ihe emebiela.
Nke a mere BBC ji chọọ icheta nwoke a n'ụbọchị ọ nwụrụ n'afọ 47 gara aga.
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya
- A mụrụ ya n'afọ 1900, n'Amanagwu dị n'Arọchukwu dị n'Abịa steeti.
- Ya na Akanu Ibiam bụbu gọvanọ ebe a ma dịka "Eastern Region", gakọrọ ụlọakwụkwọ "Hope Waddell Training Institution" otu oge. Ka ọ na-agụcha ka Nnamdi Azikiwe banyere ịgụ nke ya n'otu ebe ahụ.
- O kuzitere ọnụ ya na nkuzi, nke mere e ji ziga ya na mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'afọ 1946 ka ọ banyere n'ụlọomeiwu nke "Mpaghara ọwụwa-anyanwụ". Nke a mere ka ọ bụrụ otu n'ime naanị ndị na-anọchite anya ọwụwa-anyanwụ atọ nọ n'ụlọomeiwu oge ahụ.
- O hibere ụlọakwụkwọ "Aggrey Memorial Secondary" n'Arọchukwu.
- E ji maka mbọ niile ọ gbara oge ọ na-arụrụ gọọmentị na ngalaba agụmakwụkwọ, hibe ụlọakwụkwọ "Alvan Ikoku Federal College of Education", otu okporoụzọ dị na Maitama n'Abuja nakwa tinye ihu ya n'elu N10, ka e ji na-echeta ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






