October 1st: Ị ma ugboro ole ego Naịjirịa gbanwerela?

Ka agbụrụ dị iche iche na-etolite ka ego Naịjirịa na-agbanwe nke mere na ọtụtụ nwere ike nọrọ n'amaghị isi mbido ya.

Puku naịra
Nkọwa foto, CBN biputara akwụkwọ puku naịra mbụ n'afọ 2005. Ọ bụ ya bụ ego kacha gbagolite n'ego Naịjirịa. Ihu Aliyu Mai-Bornu na Clement Isong bụ ndị Naịjirịa mbụ ga-abụ ndị isi ụlọakụ kachasị na Naịjirịa a kpọrọ 'Central Bank of Nigeria' na Bekee.
Narị naịra ise
Nkọwa foto, E biputara akwụkwọ narị naịra ise nke mbụ n'afọ 2001. E biri ihu dike Igbo bụ Nnamdi Azikiwe a ma dịka 'Zik of Africa' n'ihu ya. E sere okpo mmanụ 'oil rig' n'azụ ya
Narị naịra abụọ
Nkọwa foto, E biputara akwụkwọ narị naịra abụọ nke mbụ n'afọ 2000. E biri ihu Ahmadu Bello bụ onyeisi mbụ nke ndị Ugwu Naịjirịa. N'azụ ya, e sere mkpokota piramidi mkpụrụ nri nakwa ehi na ngwa nri ndị ọzọ.
Narị naịra ochie

Ebe foto si, CBN

Nkọwa foto, E biputara narị naịra n'afọ 1999. E sere ugwu nkume Zuma dị n'Abuja n'azụ ya, ma see ihu Obafemi Awolowo n'ihu ya.
Narị naịra
Nkọwa foto, E bigharịrị narị naịra ọhụrụ n'afọ 2014 iji mee emume afọ 100 ehibere Naịjirịa. E biri ihu Obafemi Awolowo bụbụ onyeisi na mpaghara ọdịda-anyanwụ. E tinyekwara ya ihe ọ ga-abụ iwegharịa ekwentị gị n'ihu ya ọ kpọga gị na websaịt ga-akuziri gị ihe banyere akụkọ mgbe gboo Naịjirịa. N'azụ naịra 100 nke ọhụrụ a, e sere ya ụmụnwaanyị dị iche iche nakwa ụmụnwoke abụọ na-agba egwu.
Naịra iri ise
Nkọwa foto, E biputagharịrị akwụkwọ naịra iri ise nke na-ara ahụ ndọka a kpọrọ 'polymer' na Bekee n'afọ 2007. E sere isi ndị si mpaghara dị iche iche gụnyere onye Igbo n'ihu ya. N'akwụkwọ N50 nke ochie, e sere ndị na-akọ ugbo n'azụ ya, mana n'azụ nke ọhụrụ, e sere ndị gbutere azụ gbara agba. E ji Igbo, Hausa na Yoruba dee N50 n'azụ ya.
Naịra iri abụọ

Ebe foto si, Banknotes.com

Nkọwa foto, Dịka CBN si dee, mbụ e biputara naịra iri abụọ bụ n'afọ 1977 tupu a gbanwee ya n'afọ 1984. E biri ihu Murtala Muhammed bụbu onyeisiala n'ihu ya. E mechara bigharịa ya n'akwụkọ 'polymer' n'afọ 2007. Enweghi ihe ọbụla e sere n'azụ nke mbụ mana oge e mere ya 'polymer', e biri otu ọkpụite bụ nwaanyị a na-akpọ Ladi Kwali n'azụ ya. E jikwa asụsụ Igbo, Hausa na Yoruba dee 'twenty naira' n'azụ ya.
Naịra iri

Ebe foto si, Banknotes.com

Nkọwa foto, E biputaburu naịra iri n'afọ 1973, gbanwee ya n'afọ 1984. E bigharịrị ya n'akwụkwọ 'polymer' n'afọ 2007. E ji Igbo, Hausa na Yoruba dee 'ten naira' n'azụ ya. E biri Alvan Ikoku bụ onye Igbo ji eme ọnụ n'ihu ya. N'azụ ya, e sekwara ndị Fulani na-ere mmiri ara ehi.
Naịra ise
Nkọwa foto, E biputara naịra ise na 'polymer' n'afọ 2007. E biri Tafawa Balewa n'ihu ya, ma dekwa 'five naịra' n'asụsụ Igbo, Hausa na Yoruba n'azụ ya. E sekwara ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-agba egwu mkpọkịtị n'azụ ma nke ọhụrụ ma nke ochie (a kwụsịrị ikesa nke ochie n'afọ 2007 tupu nke 'polymer' apụta). N'azụ nke akwụsịrị ikesa n'afọ 1984, e sere onye na-eke nkwụ.
Ego igwe

Ebe foto si, CBN

Nkọwa foto, E biputara naịra abụọ n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2007. Nke ahụ a na-enwe naịra abụọ n'ego Naịjirịa. E sere ụlọomeiwu Naịjirịa n'azụ ya.
Ego igwe

Ebe foto si, CBN

Nkọwa foto, E wepụtagharịrị otu naịra n'ego igwe n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2007 , n'ọnwa Juun nke afọ ahụ ka a kwụsịrị ikesa nke ochie.
Kobo iri ise

Ebe foto si, CBN

Nkọwa foto, E wepụtara kobo iri ise n'ego igwe n'afọ 1991. E mechara kwụsị ikesa ya n'afọ 2007. E sere uwe agha 'coat of arms' Naịjirịa n'azụ ya. Tupu nke igwe apụta, e nwere nke akwụkwọ e biputara n'afọ 1973 ma kwụsị ikesa ya n'afọ 1978.
Otu Paụnd

Ebe foto si, Banknotes.com

Nkọwa foto, N'afọ 1959, ụlọakụ etiti bụ CBN, biputara otu paụnd nakwa paụnd ise, mana e mechara kwụsị ikesa ya n'afọ 1965. N'azụ akwụkwọ otu paụnd, e sere onye na-eke nkwụ, n'ihu ya, e biri ụlọ bụbu ụlọọrụ CBN na Legọs.
Akwụkwọ Shilling

Ebe foto si, Banknotes.com

Nkọwa foto, N'afọ 1959, CBN biputara Shilling ise nakwa iri n'akwụkwọ mana e mechara kwụsị ikesa ya n'afọ 1965. E sere ndị na-akwọbi osisi n'azụ shilling nke ise n'azụ ya ma see ụlọọrụ CBN n'ihu ya.
Ego igwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Enwere oge ọ bụ mkpụrụ ego a kpọrọ 'penny' ka a na-eji azụ ihe na Naịjirịa nakwa mpaghara Afrịka ndị ọzọ.
Ego ayọrọ

Ebe foto si, CBN

Nkọwa foto, Mgbe gboo, a na-ejibu ego ayọrọ nke Bekee kpọrọ 'cowries' azụ ahịa.
Ego manịla

Ebe foto si, CBN

Nkọwa foto, Ndị si n'akụkụ Rivas steeti na-eji ihe a kpọrọ manịla eme ego azụmahịa nakwa ụgwọisi nwaanyị n'oge Jaja nke Opobo dị ndụ.
Ụgwọ weta isi were isi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tupu Naịjirịa echewe uche inwe ihe bụ ego akwụkwọ, ndị mmadụ na-eme 'weta isi were isi' bụ ihe Bekee kpọrọ 'trade by barter' iji nweta ihe ndị ha ji elekọta onwe ha. Ha na-eji ihe ndị dịka nnu, mmanụ, akwa a kpara akpa, nkata, ewu na ọkụkọ nakwa ihe ndị ọzọ ha nwere iji gbazite ihe ndị ha chọrọ.