Voting in Ghana: Nana Akufo-Addo nke NPP, John Mahama nke NDC, onye ga-emeri ntuliaka nke 2020?

Nana Akufo-Addo nke NPP, John Mahama nke NDC, onye ga-emeri ntuliaka nke 2020?

Ebe foto si, Other

John Mahama nke pati 'National Democratic Congress' (NDC) na Onyeisiala Nana Akufo-Addo nke 'New Patriotic Party' (NPP) anatala amụma e buru n'isi ha, nke kwuru na ha ga-emeri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana a ga-eme n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba 2020.

Onye amụma Nigel Gaisie bụ onyeisi ụlọụka a kpọrọ 'Prophetic Hill Church', buru amụma maka ya bụ ntuliaka, kwuo na "mgbanwe na-abịa".

Gaisie a ma ama n'ihi oke amụma ya nke ọ na-akpọkarị "Jesus agenda", kwuru sị na ọ bụ Mahama bụbu onyeisiala mba Gana ga-emeri ntuliaka nke afọ 2020 a.

Gaisie dere na Facebook ya n'ime ụbọchị ole na ole gara aga sị:

"Ntuliaka 2020 kwesịrị ka e jiri ime mmụọ nakwa ịgbado anya soro ya, ka pati na-ama aka gbado anya sị...*ANYỊ GA-AKỤSASỊ IHE HA JI BIRI* ANYỊ AGAGHỊ AHAPỤRỤ HA ỌCHỊCHỊ ETU AHỤ KA CHINEKE KWURU".

Nkwa onye ndọrọndọrọ kwere

Pịa aha onye na-azọ ọchịchị a ka ị hụ njirimara ya nakwa nkwa ọ na-ekwe ndị ọ chọrọ ịchị.

John Mahama

National Democratic Congress

John Dramani Mahama bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Gana ma bụrụkwa onye ọkachamara na mgbasaozi, na odeakwụkwọ a mụrụ n'ezinaụlọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-amasị n'ụbọchị 29 nke Nọvemba 1958.

Ahụike

  • Inye ọgwụgwọ ahụ nke mbụ n'efu
  • Ikwado mgbochi ọrịa, ahụike nakwa ọdịmma.
  • Ịchabi ọnwụ nne na nwa ruo ọkara etu ọ dị ugbua.
  • Ike ụmụaghọghọ na-agụ akwụkwọ akwa nsọ nwaanyị.

Mwulite ihe e ji enyere ndụ aka

  • Imalite nkwado mwulite obodo ruru ijeri dọla 10 nke a kpọrọ 'Big Push'. Nke a pụtara itinye ego ahụ n'ime ihe gbasara mwulite akụnaụba n'ime ihe ruru afọ ise.
  • Ihibe mahadum ọhụrụ ise na ụlọọgwụ na mpaghara ndị enwebughi
  • Iji ihe ruru afọ anọ rụọ opekatampe ụlọ obere ego ruru puku iri abụọ n'ime mpaghara 260, municipal na mpaghara n'oge karịrị afọ anọ.

Agụmakwụkwọ

  • Mgbasa atụmatụ agụmaakwụkwọ n'efu maka ndị nọ n'ogogo sekọndịrị dị elu n'ụlọakwụkwọ ndị mmadụ nwe nke dị n'obodo emepeghi emepe.
  • Kpochapụ ma kwụsị atụmatụ mere ka buliri ọnụego ịgụ akwụkwọ.
  • Rụchapụ ụlọakwụkwọ ndị a gbahapụrụ nke ga-enyere ụmụakwụkwọ ọhụrụ aka.
  • Kpalite atụmatụ iji tekịnụzụ na Wi-Fi agụ akwụkwọ iji nyere ụmụakwụkwọ aka n'agụmakwụkwọ

Akụnaụba

  • Kepụta akụnaụba site na ngalaba nrụpụta ga-arụ ọrụ kwa ụbọchị akwụsịghị akwụsị.
  • Ha ga-eji afọ anọ kewapụta ọrụ dị otu nde n'ime ọnọdụ azụmahịa dị mma.
  • Malite ịrụ okporoụzọ ndị jikọrọ ime obodo na-arụpụta nri na obodo ndị mepere emepe

Nana Akufo-Addo

New Patriotic Party

A mụrụ William Dankwa Akufo-Addo n'ụbọchị 29 ọnwa Maachị, afọ 1944, a zụrụ ya na Accra; ọ bụ nwa Edward Akufo-Addo na Adeline. Onyeisiala Nana Akufo-Addo bụ ọkaiwu na Gana tupu ọ banye ndọrọ ndọrọ ọchịchị

Ahụike

  • Ịrụ ụlọọgwụ dị 101 nke nwere akwa ndina 100.
  • Ịrụpụtara ndị dọkịta na ndị nọọsụ ebe obibi n'ụlọọgwụ dị na mpaghara ahụ.
  • Rụọ ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Gana.
  • Rụọ ụlọọgwụ ọhụrụ abụọ a na-agwọ ndị isi mgbaka ma mezie ndị dị bu adị

Mwulite ihe e ji enyere ndụ aka

  • Ihiwe atụmatụ ga-enyere ndị tozuruoke aka ibite ego nke ọnụego nkwụghachị ya dị ala.
  • Rụọ ọtụtụ ụlọ obibi dị ọnụ ala n'ime afọ anọ na-abịa abịa.
  • Rụọ okporo oloko Western,Tema gawa Mpakadan, Aduadin gawa Obuasi tinyere nke si Gana gawa Burkina.

Agụmakwụkwọ

  • Gaa n'ihu n'atụmatụ SHS nakwa TVET n'efu.
  • Gaa n'ihu n'iwulite akụrụngwa ụlọakwụkwọ dị elu nke gọọmentị nwe iji nyeaka ịnabata ọtụtụ ụmụakwụkwọ.
  • Kpalite atụmatụ iji tekịnụzụ na Wi-Fi agụ akwụkwọ iji nyere ụmụ nke ụlọakwụkwọ sekọndịrị gọọmentị nwe aka n'agụmakwụkwọ.
  • Ịkwado atụmatụ agụmakwụkwọ ga-enye aka ịzụpụta ndị ọkaiwu na Gana.

Akụnaụba

  • 2020 gachaa, ha ga-aga n'ihu n'ịkwalite ọnọdụ ọrụ ọha karịrị puku abụọ ha kewapụtara.
  • Ijiko aka ụlọọrụ gọọmentị na nke ọha ga-enye aka ịkwalite ọrụrụ okporoụzọ site n'ịna ụtụ okporoụzọ.
  • Imepegharị atụmatụ njem ụgbọala n'isiobodo niile.

Ọ dọrọ ndị pati na-ama gọọmentị nọ n'ọchịchị aka ka ha kpachara anya, kwuo na ntuliaka a ga-abụ igwe na ọbara.

Onye amụma Gaisie na-ahụta na ndị NDC ga-emeri ntuliaka a, mana pati nọ n'ọchịchị bụ NPP agaghị achọ ịpụ n'ọchịchị.

N'ebe mbido afọ a, o buburu amụma na Donald Trump ga-emeri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka nke ugboro abụọ n'afọ 2020.

Onye amụma kwuru na Akufo-Addo ga-emeri

Mana, Reverend Owusu Bempah bụ onye ụkọchukwu ọzọ kwuru na Onyeisiala Akufo-Addo ka ga-azọta oche ya ọzọ ma chịrị gaa n'ihu.

N'ịsa ajụjụọnụ ndị ntaakụkọ Net2TV gbara ya, Bempah kwuru sị na Onyeisiala Akufo-Addo bụ onye na-efe ọkọlọtọ NPP, ga-emeri ntuliaka 2020, ma kwuo na amụma ọbụla na-ekwu na ọ bụ Mahama ga-emeri bụ ezigbote ụgha.

"Eji m obi umeala na-agwa ndị Gana ka ha mara na ihe m hụrụ bụ na Nana Addo ga-emeri ya bụ ntuliaka.

Mgbe ọ dị ka o ruwela oge ntuliaka oche ahụ kwesịrị ịtọgbọrọ chakoo n'ihi na ndị a na-achị na-akwado ịhọrọ onye ga-achị ha, mana nke Gana atọgbọghị chakoo, onyeisiala ka nọ n'elu ya."

O kwuru sị na amụma ndị ọzọ ndị ụkọchukwu na-ekwu na John Mahama ga-emeri bụ ezigbote ụgha. "M na-ekwu naanị ihe a e kpugherela m", ka o kwuru.

N'ime ihe niile a, amụma ndị a abụghị ejechaa ọ gwụ, dịka ndị Gana na-akwado ime ntuliaka ụbọchị Mọnde bụ asaa nke ọnwa Disemba, ebe ha ga-ahọpụta onye ga-emeri na onye ga-abụ onyeisiala mba ha, nke a ga-edu n'iyi ọrụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị.

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Ihe ọyị m nwaanyị gwara m mere m jị ṅụọ iyi na m ga-abụrịrị mmadụ dịka onye ngworo'