Onye na-arụ dịka onyeisiala mba Ghana aṅụọla iyi ọrụ

Ebe foto si, AFP
Nke a bụ ugbo abụọ n'otu izuụka onyeisi ụlọ omeeiwu mba Ghana ga-aṅụ iyi ọrụ inochi onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addorue ụbọchị 31 Jenuwarị .
Onyeisiala Nana Akuffo-Addo gara mba Etiopia maka nzụkọ ndị mba Afrịka niile a na-akpọ AU n'aha ịchafụ.
Ọ gasịa nke ahụ, ọ ga-aga mba Sout Afrịka maka akwamozu onye ogbu opi jaz bụ Hugh Masekela.
Ụlọ omeiwu Ghana duru onyeisi ha iyi ọrụ maka na osote onyeisiala mba Ghana bụ Mahamudu Bawumia nọ ezumike maka ahụike ya na London dịka ahụ bidoro ịya ya n'izu gara aga.
N'ụka gara aga, Oquaye nọchiri onyeisiala ozigbo dịka onyeisiala Akuffo-Addo gara mba Liberia maka nnabata George Weah dịka onyeisiala.
Onyeisiala Naịjịrịa agawala otu nzụkọ ahụ ebe ha ga-akpa maka agha a na-ebuso mpụ na mpaghara Afịrịka niile.






