George Weah nwere nnukwu ọrụ ka onyeisi ala Liberia

George bụ ọgbaa bọọlụ mbụ na Afrika eturu ugo dika 'Fifa World player of the year'

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, George bụ ọgbaa bọọlụ mbụ na Afrika eturu ugo dika 'Fifa World player of the year'

Ọ bụ eziokwu na George Weah bụ ezigbo onye okwe na egwuregwu bọọlụ mana ndi mmadụ na-eche na ọ ga-agba mbọ.

Ịhụ na atumanya ndi Liberia n'ebe ọnọ a bughị na nkiti.

Mgbe Onye ọrụ BBC akpọrọ Fergal Keane gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ebum n'obi ya gbasara nnukwu atụmanya chere ya n'ihụ, o kwuru na enyemaka na nkwado ndi Liberia ga-eme ka o me ọfụma dika onye isi ala ọchịchị obodo ahụ.

Aha onyonyo, Sitere n'ịgba bọọlu bụrụ onyeisi ala Liberia

Nke a bụ oge mbụ n'ime afọ iri na asaa ana-enwe mgbanwe ọchịchị n'udo.

Kedụ ihe ndi mmadụ na-ekwu

Otu nwoke akpóró Joseph Duo bụ onye agha mgbe di na nwata siri na George Weah bụ olileanya ndị Liberia nwere iji were gbanwe ọnọdụ ha.

George abatala ọchịchị ma kwekwa nkwa na ya ga-kpochapụ mmerụ aka, dozie agụma akwụkwọ na nlekọta ahụ ike ma wetara ọtụtụ ndị Liberia puku na puku ọrụ.

O sị na ọ ga-agba mbọ hụ na omezuru mkwa nille a maka ihunanya ndị Liberia nwere na ebe ọ nọ.

Akara ojii

Ihe ise maka George Weah:

George Weah

Ebe foto si, Reuters

  • Tupu ọ bịdo ịzọ ọchịchị, George Weah na ewu ewu na Liberia mana ụwa nile. O nwetere nnụkwụ aha na otu asọmpị Paris St-Germain (PSG) na AC Milan
  • Weah bụkwa otu onye na Afurịka a họpụtalụ maka nnụkwụ ọkwa ndi ọsụmpị bọọlụ na-akpọ "Fifa World Player of the Year" na ọzọ bụ "Ballon D'Or"
  • George Weah nalụ ezumike nka na asụmpị bọọlụ na afọ 2002 ka nkwado onyelu ndi otu ọsụmpi Liberia ezulu ikwanye ha na asọmpị nke ụwa nịle anakpo world cup na onu Bekee. Liberia zọkwala asọmpi nke mba Afurika na otu alọ ahu, mana ha ejeteghị aka
  • Nkwado Weah na enye ndi otu asọmpi Liberia karịrị: Ọ rụrụ ọrụ ka onye ndu, nye kwa ha ego ha jị ego ngwọ ọrụ ha ji azọ asọmpi, ma nnwebata onu akwụkwọ ebe ana ha mụrụ ịzọ asọmpị na Liberia
  • Amụrụ George Weah na mpaghara Monrovia nke a na-akpo Clara Town.
Akara ojii