E jighị Nnamdi Kanu na Singapore- ọkaiwu Ipob
Otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob n'ịchafụ ekwuola na akụkọ na na ndị uweojii mba Singapore anwụchiela Nnamdi Kanu bụ "akụkọ ụgha".
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharịrị na soshal midia na-ekwu na ndị uweojii mba Singapore nwụchiri Kanu oge o mere njem na mba ahụ na nsonso a maka ihe o kwuru gbasara ngagharịịwe endSARS.
Mana ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimakor kwuru na ebubo ahụ bụ okpotokpo asị sị n'aka "ndị ahụghị Nnamdị Kanu anya."
Na mkparịtaụka Ejimakor na BBC Igbo nwere n'ekwentị ụbọchị Tuzde, o kwuru na "Nnamdi Kanu anọghị na Singapore, ọ nọ na UK".
O kwuru na o nweghị ihe Nnamdi Kanu mere nke e nwere ike iji maka ya were ndị uweojii gaa jichie ya iji kpụlata ya Naijiria.
O gara n'ihu kwuo na ikike Nnamdi Kanu nwere ịga mba dị iche iche n'ụwa dịka Israel, Belgium, Canada, na ọtụtụ ndị nọ n'ọkwa ọchịchị na Naijiria enweghị ya.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:
Na akụkọ ahụ na-efegharị, a na-ebo ebubo na e jidere Nnamdi Kanu iji kpụlata ya Naijiria ịbịa zara ọnụ ya dịka e nwere ọtụtụ akwụkwọ mkpesa e dere megide ya nke na-ebo ebubo na o ji okwu ọnụ kpalite mmụọ ndị gara buso ndị uweojii agha oge ngagharịiwe EndSARS, gbuo ụfọdụ ma mebikwa ọtụtụ ihe.
Ndi uweojii mba Singapore asaghị BBC Igbo asịsa banyere ajụjụ anyị jụrụ ha maka ya bụ okwu.
Ha kwuru na ọ bụ naanị ndị uweojii Naijiria pụrụ izitere ha ụdị ajụjụ ahụ.
Anyị enwetabeghị ọsịsa ndị uweojii Naijiria dịka akụkọ a na-apụta.















