'Etu Nnamdi Kanu si chọọ ịlakọ mụ na Chi m'- Ụkọchukwu Peace

Ebe foto si, Nnamdi Kanu Facebook
Ọnụ na-ekwuburu Indigenous People of Biafra n'Abuja bụ ụkọchukwu Peace enyela Nnamdi Kanu ga-enyere ya aka chịkọta otu Indigenous People of Biafra na-ekewasị.
O kwuru na ọ bụ makana Nnamdi Kanu chọrọ ịlakọ ya na chi ya site n'iche ya ndị otu Ipob ndị ọzọ n'arụsị dị n'Arochukwu mere o ji rie mbo mbo ọsọ n'otu ahụ.
Mana Peace kwuru na ife arụsị abụghị ihe ya na chi ya kpara.
Peace kwuru si na ọ chọghị isonye n'otu na-ekwu na ha na-enweta nwereonwe ma na-akwanye ndị mmadụ n'agbụ nke ọkpụkperechi.
O kwuru na ọ bụ n'afọ 2019 ka o kpebiri na ọ ga-apụ n'otu Ipob.
Ndụmọdụ ụkọchukwu Peace na-enye Nnamdi Kanu
Kanu emezina na ọ bụ ya kacha mara ihe niile.
Ya nye ndị ọzọ ohere ka ha weta echiche ọma ha n'iwulite ọdịma otu Ipob.
Agbanwela ebumnobi Ipob si n'ikwanye ndị mmadụ n'okpukperechi.
Kanu kwụrụ n'eziokwu, ya ejizina aha chukwu atụ asị.
Kwe ka ndị ọkammụta maa ka-esi edepụta okwu onye ọchịchị ga-ekwu,dere gị ihe ị ga-ekwu.
Kwụtụ obere ụka, ma mee ọtụtụ ihe dị mma.
Nye ndị mmadụ ohere iweta alo ọgbara ọhụrụ ga-ewulite otu Ipob.
Mana ọkaiwu Ipob bụ Alloy Ejimakor kwuru na o nweghị mgbe Nnamdi Kanu ji kwuo chee ndị otu ya n'arụsị.
Onyeisi ọzọ ọ pụọla n'otu Ipob? Lee ihe anyị ma

Akụkọ na-ekwu na Mazi Obidi Obienu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na Notu Amerịka apụọla n'otu ahụ.
Na soshal midia, ozi anyị ka na-eyocha e depụtara ebe Nnamdi Kanu chụrụ ya bụ nwa amadi na-efegharị.
Ozi ahụ BBC Igbo amabeghị ma o si n'aka Obienu kwuru na o nwetara ozi n'aka Nnamdi Kanu kwuru ka ọ kwụsị ọrụ dịka onyeisi Ipob na Notu Amerịka makana o kpọrọ ọgbakọ na-anataghị ndụmọdụ Kanu.
Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ
Ihe Ipob sara Uche Mefor maka ebubo na ha chụpụrụ ya na redio Biafra
Alloy Ejimakor bụ ọkaiwu Indigenous People of Biafra ekwuola na Uche Mefor kwesiri ị gee Nnamdi Kanu nti n'ihe ọbụla ọ gwara gbasara redio Biafra makana ọ bụ onyeisi otu Ipob.
O kwuru na Mefor chọọ, ya ga mepee redio nke ya makana onye ọbụla nwere ohere ị mee ka o si sọ ya.
Lee ihe niile o kwuru n'uju ebe a:
'Etu Nnamdi Kanu si kwapụ m n'ụgbọ redio Biafra'- Uche Mefor

Ebe foto si, Getty Images/Uche Mefor Facebook
Onye kpọrọ onwe ya osote onyeisi Ipob bụ Uche Mefo etiwasala ihe na-esere ya na Nnamdi Kanu.
O kwuru na Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu ahụ gbanwere redio Biafra bụ nke ya bụ Mefo so hibee na agwaghị ya agwa.
Akụkọ ihe na-esere ha n'uju
Mefo kwuru na ndị otu Ipob pụtabụrụ na-ekwu na ọ na-ebi ndụ ihu mma abụọ. "Ha kwuru na a ga-achụ m n'otu ahụ."
O kwuru Kanu gara n'ihu gwa ndị mmadụ ha nwete Ipob community redio ma hapụ radio Biafra.
"Nke a mere ka ndị mmadụ tụwa m aka na ha ma na mụ bụ Uche Mefo nwere ihe ọjọ m bụ n'obi."
O kwuru na Kanu gakwara n'ihu wepụ ụfọdụ ndị na-ekwubu okwu na redio Biafra.
Mefor kwuru na Kanu mere nke a na-agwaghị ya.
N'okwu ya, "ndị mmadụ na-ajụ m gịnị na-eme, kedụ ihe m ga-aza ha."
Mefo kwuru na mgbe Kanu gwara ya ya nye onye ọzọ akara eji aba radio Biafra , ọ jụru ajụ.
Ọ jụrụ ya si kedụ ihe mere iji emepe Ipob community redio, ruo ugbua Kanu azabeghị ajụjụ a.
N'okwu ya," Nnamdi Kanu akparịala m nke ukwu."
"E kwuwe okwu mmalite radio Biafra , a ga-akpọpụtarịrị aha m mana taa otu onye nọ otu ebe na-achọ ịkpọm ewu."
O kwuru na kedụ ka Nnamdi Kanu ga-esi na-ekpe ekpere ma na-atụ asị n'elu ihe gbasara okwu redio Biafra.
O kwuru na etu ihe si kwụrụ ugbua bụ na o nweghịzị akara e ji aba redio Biafra.
O kwuru na aha redio nke ọ na-emepezi ugbua bụ Biafra Human rights redio.
N'okwu ya, ọ bụrụ na Kanu chọrọ ka ọ kwụsị redio ọhụrụ nke ya , Kanu mara na Ipob community redio ga-akwụsịkwu.
Mefo kwuru na okwu nke a senitere isi bụ nke kacha wute ya mere o ji pụta kwupute okwu hoha.
Cheta na otetụla a na-anụ kepukepu na Nnamdi Kanu na Uche Mefo na-enwe obere esemokwu mana Mefo apụtala kpọọ okwu aha.
Ihe ọkaiwu Ipob sara Uche Mefo
Okaiwu Ipob bụ Alloy Ejimako ekwuola na Nnamdi Kanu nwereike ị nara Uche Mefo akara e ji abanye redio Biafra oge ọbụla sọrọ ya makana adịghị adị abụọ abụ eze.
Gbasara okwu na Mefo ga-emepe redio nke ya, Ejimako kwuru na Mefo nwekwara ike ịchụwa Biafra n'ụzọ nke ya ma ọ chọọ.
Ihe o kwuru n'uju ga-abata na-eteghị aka ugbua.














