Ihe mere ozu ụmụaka atọ nwụrụ na Itchi dị na Nsukka

Ebe foto si, Screengrab
Ihe nkiri na-efegharị n'elu soshal midia na-egosi etu e si e bupute ozu ụmụaka nwụrụ n'obodo Itchi dịketere dị n'okpuruọchịchị Igbo Eze South, Nsukka, Enugu steeti na-ebuba ya n'ụgbọala ndị uweojii.
O nwebeghị onye ma etu ụmụaka ahụ si nwụụ mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugwu steeti kwuru na ha na-enyocha ọnwụ ụmụaka ahụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ nne maọbụ nna ụmụaka ahụ gbasara ihe kpatara ọnwụ ha.
Otu onye zara Chijikem Ugwuanyi na Facebook wepụtara ihe onyonyo ahụ na facebook ma na-ajụ ihe gburu kịrịkịrị ụmụaka atọ ahụ.
Onye wenitere isi n'okpuruọchịchị Igbo Eze South na-achọghị ka-akpọpụta aha kwuru na o nweghị ihe ọma ma maka ya bụ okwu makana a ka na-eme nyocha gbasara ihe e kwuru mere ebe ahụ.
Akụkọ ka na-abịa.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:





