Ihe i kwesịrị ịma maka Peter Obi e ji 'Okwute ndị Igbo maara

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook
Igbo tụrụ ilu sị na onye a na-akpọ nwere ihe ọ na-eme.
Etu a ka ọ dị n'ebe nwa amadị a bụ Peter Obi nọ dịka ndị mmadụ kpụ ya n'ọnụ n'ihi ihe o kwuru maka Naịjirịa ịbanye ọtanisi nke ugboro abụọ n'afọ ise.
Obi kwuru na Naịjirịa chọrọ ipụta n'ọnọdụ a, na gọọmentị kwesịrị ibelata aka n'ego ha na-emefu maka bọjetị ma were ego tinye n'akụnaụba na-arụpụta ihe.
Ọtụtụ ndị mmadụ nabatara ihe Obi kwuru, ebe ndị ọzọ na-ajụ "kedụ ihe Obi mere n'ọge ọ bụ gọvanọ Anambra Steetị"?
Onye bụ Peter Obi na ihe i kwesịrị ịma maka ya?

Ebe foto si, Peter Obi twitter page
- Peter Obi bụ nwafọ Igbo a mụrụ n'Onicha, Anambra Steetị n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Julaị, afọ 1967
- Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Christ the King dị n'Onicha
- Ọ gụrụ maka 'Philisophy' na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka ma pụta n'afọ 1984
- Obi gụkwara akụkọ n'ọtụtụ mahadum dị dị n'ofesi gụnyere; Oxford, Havard, Lọndọn, Columbia, Switzerland, Cambridge na ụlọakwụkwọ Kellogg bụ ebe ọ gụrụ ihe banyere akụnaụba, azụmaahịa nakwa ego
- Ọ lụrụ nwunye ya bụ Margaret Brownson n'afọ 1992, ha mụta ụmụ abụọ bụ Gabriella Nwamaka Frances Obi na Gregory Peter Oseloka Obi
- Obi chịrị Anambra Steetị afọ asatọ dịka gọvanọ maliter n'afọ 2006 ruo afọ 2014
- Ọ zọrọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa n'aha PDP n'afọ 2019 mgbe Atiku Abubakar họrọ ya dịka osote mana ha dara na ntuliaka ahụ
- Obi arụọla ọrụ n'ọtụtụ ụlọọrụ dịka Next International Nigeria Ltd, Future View Securities Ltd, Guardian Express Mortgage Bank Ltd, Paymaster Nigeria Ltd, Corp Ltd and Card Centre Ltd dgz
- N'ihi ọrụ ọrụrụ n'Anambra nakwa ntụnye n'ihe banyere akụnaụba nakwa ndị Igbo mere ụfọdụ ji etu "okwute ndị Igbo".
Nturuugo
Obi ritere ọtụtụ nturuugbo gụnyere;
- Gọvanọ kachasị mma n'afọ 2010 nke West Africa ICT Development
- Nwoke kachasị mma n'afọ 2007 (Man of the Year) nke Sun Newspaper
- Gọvanọ kachasị mụrụ akọ na Naịjrịa n'afọ 2009 nkeThisday Newspaper
- Gọvanọ kachasị mma ntụkwasị obi na Naịjirịa n'afọ 2009 nke Champion Newspaper
- Nturugo ọkachasị na ndị ndu n'afọ 2011 a kpọrọ Zik Leadership Prize
- Gọvanọ kachasị n'ọrụ inye ọgwụ mgbochi n'Ọwụwanyanwụ n'afọ 2012 nke Bill & Melinda Gates Foundation dgz.




