Peter Obi: Enweghi ezigbote ọchịchị bụ ihe kachasị egbu Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Onye zoburu ọchịchị osote onyeisiala n'okpuru otu Peoples Democratic Party (PDP) bụ Peter Obi sị na Onyisial Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwesiri isoro usoro mba Saụt Afịrịka na India ọkachasị ebe ọmetụtara ịhọpụta ndị ga-eso ya rụọ ọrụ.
Val Obienyem bụ onye mgbasa ozi Peter Obi gwara BBC Igbo na-ọbụ eziokwu na onye ndu ya kwuru okwu na mkparịta ụka ya na ndị ntaaakụkọ nwere na ngwụcha izuụka.
N'okwu ya, Peter Obi sị na Naịjirịa ataala ahụhụ site na-enweghị ezigbote ọchịchị: "Onye ọchịchi kwesiri ịma ebe ọ na-aga. mana, anyị nwere ọtụtụ ndị adịgboroja na-eme ka ha abụ ndị ndu."
Ọ gakwar n'ihu si na oke mbụte na-etinye Naịjirịa na nsogbu.
"Gwa m, ọ gịnị na-arụ ọrụ na Naịjirịa ugbua? Obodo ebe eji ijiri kwa ijiri."
Peter Obi gara n'ihu katọ onyeisiala Muhammadu Buhari maka etu ojibeghi hoputa ndị ga-eso ya rụo ọrụ.
Ozi onye mgasaozi ya sị na o ji Cyril Ramaphosa nke Saụt Afịrịka na Narendra Modi nke India maa atụ, ọkachasị etu ọ sị na ha mere ngwa ngwa wepụta ndị ha na ha ga-arụ ọrụ.
Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Buhari sị BBC Igbo na ya achọghị itinye ọnụ n'ihe Peter Obi kwuru ugbua.
Cheta na Peter Obi na onye ya na ya so zọọ ọkwa na ntuliaka emere ụbọchị 23 nke ọnwa Febụwarị 2019.
Ha nọ n'ụlọikpe ugbua na-arịọ ka akagbuo mmeri Buhari meriri ha makana ha sị na ọbụghị n'ezie.








