Enugu state: Ụmụaka asatọ anwụọla n'ime olulu mmiri

Mmadụ asatọ anwụọla n'ime olulu mmiri n'egwu

Welụ mmiri

Ebe foto si, Magnum Photos

Ụmụokorobịa asatọ nwụrụ n'ime welụ n'Igogoro, Enugu-Ezike dị n'okpuruọchịchị Igboeze North, Enugu steeti, ụbọchị Monde, Julaị 22,2019.

Odobeghị anya ihe gburu ha, mana a na-eche na ọ bụ anwụrụọkụ si n'injin ha chọrọ iji mipụta mmiri na ya bụ welụ.

Mmadụ abụọ ọzọ anwụọla na ngagharịiwe ndị Shiite

Ngagharịiwe ndị Shiite

Ebe foto si, Ibrahim Musa

Ọ ka na-akpọtụ n'Abuja ebe mmadụ abụọ ndị otu shiite nwuru maka ngagharị iwe ha na-eme maka onyeisi ha bụ El-Zakzaky gọọmenti ji.

Onye ndụmọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Femi Adesina ekwuola na ihe mere gọọmenti ejibeghị hapụ El-Zakzaky bụ maka na gọọmenti tinyere akwụkwọ ka ekpegharịa ya bụ ikpe.

Boris Johnson eweghaarala Ochịchị mba Briten

Bosi Johnson

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Bosi Johnson anọchiela Theresa May dịka onyeisiala mba Briten

N'ofesi, Boris Johnson bụ onye weghaara ọchịchị dịka onyeisiala mba Briten ga-amalite ọrụ ya taa bụ Wenzede.

A tụrụ anya na Johnson ga-akpọpụta ndị ọrụ ya ozugbo ebe Queen Elizabeth nyegoro ya ikike.

Real Madrid emeela Arsenal akpịrị ogologo

Gareth Bale nyere goolu na nkeji 59

Ebe foto si, Matthew Ashton - AMA

Nkọwa foto, Akụkọ na-ekwu na Bale nwere ike ịhapụ Madrid n'oge adịghị anya.

Real Madrid ji agba penariti wee merie Arsenal n'asọmpi enyi na enyi ha gbara na mba Amerịka n'abalị Tuuzdee.

Arsenal bụ ụzọ nye goolu abụọ site n'aka Alexandre Lacazette na Pierre-Emerick Aubameyang.

Mana Gareth Bale na Marco Asensio sachara goolu abụọ ahụ n'agba nke abụọ.

Egwuregwu ahụ bara na penariti ebe Real Madrid ji goolu atọ asatara abụọ wee turu ugo.

Subriel Matias etigbuola Maxim Dadashev

Maxim Dadashev

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Maxim Dadashev nwụrụ maka ọkpọ Maxim Dadashev kụrụ ya

N'ewguregwu, otiọkpọ Subriel Matias etigbuola Maxim Dadashev nke Russia n'ọkpọ nke Bekee kpọrọ light-welterweight nke International Boxing Federation akụrụ na Maryland, US.

Odeakwụkwọ IBF bụ Umar Kremlev na-eche na ọ nwere ka Matias siri daa iwu asọmpi ahụ.

N'akụkọ mechara pụta ihe, Dadashev mechara laa mmụọ, site n'ihe mmerụ ahụ o nwetara n'ọkpọ Matias suru ya.

Ọ dị naanị afọ 28 mgbe ọ nwụrụ.

Gee nkeji Igbo

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị