El-Zakzaky: Ihe mere ndị Shi'ite jiri gbuo onye uweojii na Kadụna

Ọghabghara dapụara ụnyaahụ na Kaduna oge ndị ofufe Shi'ite bara n'oge ime ngagharị iwe maka onyeisi ha bụ Sheikh El-Zakzaky na ndị ọzọ gọọmenti Naịjirịa ji.
Akụkọ kwuru na ndị ahụ na-eme ngagharị iwe jiri okwute tugbuo otu onye uweojii n'ime ọgbaghara ahụ ma gbaakwa otu ụgbọala ndị uweojii ọkụ.
Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na Kadụna steeti bụ Mukhtar Aliyu kwupụtara nke a ma kwuo na ya ga-enye akụkọ mere n'uju.
Akụkọ na-ekwuna a gbara egbe n'akụkụ ahịa Gumi dị na steeti ahụ nke mere ndị ahịa ji kpọchie ọnụahịa ha wee wara ọsọ.
Nke a na-abịa dịka a kpọrọ onyeisi ha bụ El-Zakzaky na nwunye ya bụ Zeena gaa Kadụna ụnyaahụ maka ikpe ha mana ekpenwughi ha ikpe maka na onye ọkaikpe ji ikpe ahụ bụ Gideon Kurada anọghị.
Ọkaiwu El-Zakzaky na nwunye ya bụ Femi Falna gwara ndị ntaakụkọ na nkpọpụta a chọrọ ịkpọpụta onye ọ na-anọchite agaghị amịta mkpụrụ maka na ndị ụlọikpe n'Abuja ekwuola ka ahapụ ya site na bel ma na gọọmenti Naịjirịọ́ ekweghi nke ahụ.
E jidere El-Zakzaky n'afọ 2015 ebe ngagharị iwe ndị otu n'ebe dị icheiche na-ebute ọgbaghara

Akụkọ ga-amasị gị:











