Lee ọrụ ndị i kwesịrị ịtụ anya ha n'aka ndị nnọchiteanya gị n'ụlọomeiwu

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Uru kachasị mkpa dị n'ime ọchịchị onye kwuo uche ya (ọhakarasị) bụ mwulite ndụ ndị mmadụ na mmepe ime obodo.
Mana ọrụ mwulite obodo bụ otu okwu dị ezigbote mkpa na Naịjirịa kamgbe a banyere ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999.
Nke a malitere na mbido ọchịchị Onyeisiala Olusegun Obasanjo n'afọ 1999 mgbe ndịisi ụlọomeiwu gakwuuru ndịisi ọchịchị etiti ka e nye ha ikike ịrụ ọrụ mwulite obodo 'Constituency project'.
Ha sị na nke a bụ site n'ọchịchọ ndị ha na-anọchiteanya ha maka ikete oke n'ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ndịisi gọọmentị etiti kwenyere ma nye ndị omeiwu ikike na nkwado site n'ịmawapụtara ha ego.

Mana i legharịa anya n'ọtụtụ obodo ugbua, ọ dịghị ka mwulite obodo ọ na-aga n'ihu na-agbanyeghi ego ndị gọọmentị na-ewepụta maka ya.
Ya mere ka anyị tulee ihe bụ 'constituency project' na ndị ọ dị n'aka ịhụ na ewulitere ime obodo.
Gịnị bụ 'constituency project'?

Ebe foto si, sciencephotolibrary
Onye omeiwu na-ekwuchite ọnụ ndị ụlọomeiwu nta bụ Benjamin Kalu sị na ọ bụ ọrụ ndịomeiwu na-arụrụ ndị ha na-anọchite anya ha.
Na ọ bụ ọrụ mmepe obodo ndịomeiwu na-arụ iji zaa oku ndị ha na-achị na-akpọ maka mwulite ndụ na obodo ha.
Ọ bụ ọrụ na-egosi na anya, ụkwụ nakwa aka gọọmentị na-eru n'imime obodo dị na mba ahụ.

N'oge ngụkọ mkpata na mmefu nke afọ ọbụla ndị omeiwu na-ekwupụta ọtụtụ ọrụrụ dị iche iche a ga-arụ na mpaghara ha na-anọchiteanya ha na ego ole ha ga-efu.
Iwu Naịjirịa nke afọ 1999 nyere ndị omeiwu ikike ka ha kwupụta ego ndị gọọmentị ga-emefu n'ọrụ ndị a dịka ọ dị na-agba 80, amaokwu nke (2, 3 na 4).
Kedụ ndị ọ dị n'aka ịrụ 'constituency project'?

Ebe foto si, Nigerian Government
E nweela ọtụtụ nrụrịtaụka banyere ndị ọ dị n'aka ha ịhụ na a rụrụ ọrụ mwulite obodo n'etiti ndị omeiwu (legislatives) na ndịisi gọọmentị etiti (Executives).
Nke a bụ eziokwu bụ na ọ dị ngalaba gọọmentị abuọ a n'aka ịhụ na ndị a na-achị ketere oke n'ọchịchị onye kwuo uche ya.
Kalu sị na ọrụ ndị omeiwu bụ ịga na mpaghara niile ha na-anọchiteanya ha ma chọpụta ọrụ ndị ahụ kwesịrị ka a rụọ n'obodo dịka ọchịchọ ndị obodo si dị.
Ha na-eme nke a site n'ịkpo ime obodo nke ndịeze, ndịisi ntoroọbịa, ndị nne, ndịisi okpukperechi ga-eso bụkwanụ ebe ndị obodo ga-ekwu ihe ha chọrọ.

Ọ bụghị ndị omeiwu ga-ahọrọ ọrụ masịrị ha kama ọ bụ ndị obodo ka ọ dị n'aka ikwu ihe ndị ha chọrọ ka gọọmentị rụọrọ ha.
Ọ sị na ndị omeiwu ga-eji ihe ndị a gaa ọgbakọ ndị ụlọomeiwu ka e nwee ike tinye n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ ahụ.
Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị etiti kwadọ ya, onyeisiala ga-ebinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu ahụ.
Ọ bụ zi ndịisi gọọmentị etiti ka ọ dị n'aka ịhọpụta ndị ọrụ ngo ga-arụ ọrụ ndị a n'obodo dị iche iche.

Ebe foto si, Getty Images
Mana ndị omeiwu na ndịisi gọọmentị etiti ga-agbakọ aka ọnụ tinyere ndị ọrụ ngo ahụ anya iji hụ na ha rụrụ ọrụ nke ọma nakwa n'oge kwesịrị.
N'aka nke ọzọ, ọ bụghị naanị ndị ụlọomeiwu na ndịisi gọọmentị etiti ka ọrụ mwulite obodo dị n'aka kama ndị gọvanọ steetị nakwa ndị omeiwu steetị nwekwara oke ha n'ọrụ mwulite obodo.
Nke a bụ maka na mpaghara steetị niile dị n'okpuru gọvanọ ya mere gọvanọ nwere oke na ọrụ iwulite obodo dị n'ime steetị ọ na-achị ya.
Ọmụmaatụ ụfọdụ ọrụ mwulite obodo

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Omeiwu Kalu sị na sị na ọtụtụ ha na-arụ iji wulite obodo nke a kpọrọ 'consttuency project' na bekee gụnyere;
- Okporoụzọ
- Ọkụ latrik
- Ịrụ ụlọobibi
- Ịgbape ezi mmiri ọṅụṅụ
- Ịrụ ụlọọrụ, ụlọ mpụta ngwaahịa nakwa ụlọ azụmaahịa dgz.
- Ịrụ ụlọakwụkwọ
- Inye ndị mmadụ ọrụ
- Izụ ndị mmadụ n'ọrụ dịka ugbo, igwe kọmpụta, azụmaahịa dgz








