Igwebuike... Etu mmepe si bata na mpaghara ọwụwa anyanwụ

Ebe foto si, Uganews.com
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ndị Igbo na-atụ ilu sị: "bunu bunu, ibu anyị danda." Nke a pụtara na a gbakọọ aka nyụọ mamịrị ọ gbaa ụfụfụ.
Akụkọ a bụ etu ndị Igbo si jiri aka ha weta mmepe n'obodo ha dị icheiche, na-echeghị enyemaka gọọmentị.
Ka a lụchara agha Biafra n'afọ 1970, ala Igbo niile tọgbọ chakoo n'ihi na ogbunigwe lara ọtụtụ akụnaụba Igbo ji eme ọnụ n'iyi.
Mana o teghị aka, ndị Igbo gbakọrọ ọnụ malitekwa iwuli obodo ha dị icheiche, na-enweghị nnukwu enyemaka ọbụla site n'aka gọọmentị.
N'agbanyeghị na Onyeisiala nke chịrị ka agha Biafra biri bụ Jeneral Gowon kwuru na aga-eji 3R arụgharị ebe ogbunigwe dara, tụmadị n'ala Igbo ka Naịjirịa wee buru otu.
Mana ndị Igbo echeghi aka n'atụmatụ gọmenti sọọsọ. Ha bidoro gbawa mbọ, wulitewakwa obodo ha site n'enyemaka si na nzụkọ ha na mba dị icheiche ha bigasị.
Otu n'ime ụzọ ha si mee nke a bụ site n'otu obodo dị icheiche nke a kpọrọ 'Town Union' na Bekee.
'Town Union' bụ ụdị otu jikọrọ ndị niile si n'otu obodo ebe ọbụla ha hụrụ onwe ha.
Ọ bụ otu ndị a na-agbakọta tụkọta ego, tụkọta alo, gbakọta aka ma na-egbo mkpa dịịrị obodo ha, na-echeghị ka gọọmentị bịa nyere ha aka.
Kedụ etu otu 'town union' si malite?

Dịka ndị Igbo bụ ndị njem, ha na-agbakọ n'obodo ọbụla ha hụrụ onwe ha iji mata onwe ha ma tụkọrịta alo.
Benjamin Obidegwu bụ onye ọkaiwu rụrụ ọrụ dịka onyeisi 'town union' nke obodo ya bụ Obodoukwu, n'Imo steeti kwuru na ọgbakọ nke ndị obodo ya malitere n'afọ 1945.

Ebe foto si, Benjamin Obidegwu
Obidegwu kọwara na ọ bụ oge a lụchara agha ka ọtụtụ gbalọtara wee hụ na enweghị ezi mmepe ọbụla n'obodo.
Nke a mere ka otu obodo ndị a malite itule ihe ha ga-eme iji mepee obodo ha ebe ọ dịka gọọmentị agbakụtala ha azụ.
Ọ gara n'ihu kọwaa ọtụtụ ihe mmepe dịka ụlọọgwụ, ụlọọrụ ndị uweojii, ama egwuregwu, ụlọakwụkwọ, nakwa ụlọ ọba akwụkwọ, bụ nke ọchịchị ya rụrụ maọbụ rụgharịa oge ọ bụ onye isi ha.

Ebe foto si, Nzuko Obodoukwu
Ngwa ka anyị gosi ebe ụfọdụ aka izu kpara nkata ọganihu n'ala Igbo:
N'Owere, Imo steeti: Ị ma na 'igwebuike' ka e ji rụọ ọdọụgbọelu Owere?

Aka chịburu Imo steeti dịka gọvanọ site 1979 ruo 1983 bụ Sam Mbakwe ketara ala ebe a ga-arụ ọdọụgbọelu n'Imo steeti.
Ndị Igbo niile pụtara n'Igwe ma kwadọọ ọrụ ahụ, nke mere na a rụchapụrụ ya bụ ọdọụgbọelu ahụ n'ihi mbọ niile Sam Mbakwe gbara, ha wee gụọ ya bụ ọdọugbọelu aha gọvanọ.
N'obodo dị icheiche otu 'Town Union' na-arụ ụlọakwụkwọ, ụlọ ọgwụ, ụlọọahịa, ụlọorụ ndị uweojii, okporoụzọ, na ihe ndị ọzọ.
O nweghi obodo mmadụ ga-aga n'ala Igbo ebe agaghị ahụ ọkpụrụkpụ ihe ndị 'town union' obodo ahụ rụpụtara.

Ebe foto si, Uganews.com
N'Abrịba, Abia steeti: Ụzọ, ọkụ latrik, enyemaka maka azụmahịa na ihe ndị ọzọ ndị Abrịba nwere
N'Abia steeti, Abiriba bụ otu obodo a ma ama ndị obodo ji aka ha wulie ala ha.
Ogbakọ obodo ha bụ 'Abiriba Communal Improvement Union (A.C.I.U.)' nyere aka nke ukwuu na mmepe obodo ha.
Otu ọgbọ dị icheiche n'Abịrịba sokwa nye aka n'ọrụ mmepe.
Lee etu otu onye si kọwaa ya n'ọbaozi Twitter:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Abakiliki, Ebonyi steeti: Abakilili Rice-Mill na ihe ndị ọzọ ndị mmadụ tụkọrọ aka rụọ
N'Ebonyi steeti, ọ bụ ndị obodo ji aka ha wulite ọrụ ugbo nkọpụta osikapa tupu gọọmentị etinyere ha aka.

Ndị obodo na-agbakọta tụkọọ ego wee na-arụ ọrụ osikapa ha ma were ego ha rụtara na-enyere onwe ha aka.
Ugbua, ma gọọmentị etiti ma nke steeti na-achụ ndị ọrụ ugbo n'Ebonyi n'ihi mkpa na-egbo n'obodo Naịjirịa.
Ịzụ ndị mmadụ n'akwụkwọ

Ebe foto si, Nzukọ Obodoukwu
O nwee otu nwata ụbụrụ ya na-aghọ nkọ n'obodo, mana nne na nna ya enweghị ego iji zụọ ya n'akwụkwọ, ndị otu obodo ga-agbakọta aka na-akwụrụ nwata dị otu a ụgwọ akwụkọ.
Oge ụfọdụ, ha na-ezipu nwata ahụ ala bekee ka ọ ga gbajie mkpịsị be ndị ọcha.
Ọ bụzị ọrụ dịịrị onye ahụ ịgba mbọ hụ na ọ zụrụ ndị ọzọ n'akwụkwọ ma nyekwara ha aka inweta ọrụ ka obodo wee na-eto.
Ịzụ ndị mmadụ n'ọrụaka maọbụ ahịa

N'agbanyeghi na nke a zuru ala Igbo dum, otu obodo pụtara ihe kacha eme nke a bụ Nnewi, dị n'Anambra steeti.
Ndị obodo na-akpọrọ ụmụaka obodo ha anya ruru ala, kpọnye ndị obodo ha ndị ọzọ na-eme ọfụma n'ahịa maọbụ ọrụaka.
Nwata ahụ ga-anọ ọtụtụ afọ ma mụtachaa ya bụ ahịa maọbụ ọrụ, tupu nna ya ukwu enye ya ego iji malite nke ya.
N'ụzọ dị otu a ka ndị ọgaranya si baa ụba n'obodo Nnewi nakwa mpaghara ala Igbo dị icheiche.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:















