August Meeting: Nzụkọ Ọgọstụ Ụmụ nwaanyị n'ala Igbo amalitela ugbua

Ụmụ nwaanyị Abatete, Anambra Steeti pụtara n'igwe iji mee mmemme nzụkọ ọgọstụ nke afọ a.
Isi okwu ha na nke 2019 bụ Ịkwado ụmụ nwaanyị maka nlekọta ezinaụlọ ha.
Onye isi ndị nne nke Odida Abatete bụ Ezinne Bridget Onwuka kwuru na ọ bụ ụmụ nwaanyị ji ụka nakwa ezinaụlọ ha.
Ọ rịọrọ ndị nne niile ka ha were oke ọrụ a Chineke tinyere ha n'aka kpọrọ ihe.
Oriakụ onwụka kọwara na ọ bụ ego ha na-atụkọta kwa afọ na nzụkọ Ọgọstụ ka ha jiri rụọ ụlọ fada nakwa ụlọ nzụkọ na-aga n'ihu n'Ụlọụka St Joseph Katọlik parish Odida Abatete, Abambra Steeti.
Onye isi ndị nne Abatete na Legọs bụ Oriakụ Jerome Odekpo kwuru na ozi ya nwere na nzụkọ Ọgọstụ 2019 bụ ka ndị nne kuziere ụmụ ha ndị nwaanyị na mmekọ nwoke na nwaanyị n'alụghị di na nwunye
abụghị ihunanya kama ọ bụ mmetọ anụ ahụ.
Ihe ndị nne a si ọtụtụ mba bịa gbakọta n'Odida Abatete mere gụịnyere ịgba egwu, nkuzi, ịmụ isi nri, imụ ime ncha, ịchụ nta ego nakwa ihe ndị ọzọ.
Nzụkọ Ọgọstụ na-aga n'ihu n'obodo niile dị n'ala Igbo ganye na ọnwa agafee.


















