Ipob Oyigbo: Ihe m hụrụ maka mwakpo Oyigbo - Onye bi ebe ahụ
Otu onye bi n'Oyigbo dị na Rivers steeti ebe akụkọ pụtara na ndị oyiegwu ji ọgbatumtum bido gbawa egbe ma gbuo ụfọdụ ndị Hausa dịka ha wakporo ogbe ha.
Onye ahụ na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na etu o si mara na nsogbu dị n'Oyigbo bụ na mgbe ọ na-edupu mmadụ n'elekere ise nke ụtụtụ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị uweojii ka ha kwụcha na-echekwa ogbe ha.
O kwuru na mgbe ọ jụrụ ajụjụ ihe na-emenụ, a gwara ya na o nwere ndị akpọrọ si ha na ha gaa wakpo ogbe ndị Hausa dị n'Oyigbo.
Mana onyeisi okpuruọchịchị ahụ Gerald Oforji kwuru na ọ bụ nyocha ndị uweojii ga-enye ha ka ha ga-eji kọwanwụ ndị na etu mwakpo ahụ si gaa.
O tiri ndị Hausa bi n'Oyigbo aka n'obi maka ihe mberede a dakwasiri ha ma na-ekwu na ha ga-agba mbọ hụ na ndị mere ihe a agaghị a na n'efu.
O kwuru na ebe niile ajụọla oyi n'Oyigbo ugbua mana dịka onyeisi okpuruọchịchị ahụ, o kwụsitụla ndị ọgbatụmtum ị gba ma elekere asaa nke mgbede kụchaa.
Ihe kọmịshọna mgbasaozi gọọmenti Rivers steeti kwuru maka mwakpo a
Paulinus Nsirim bụ kọmịshọna mgbasaozi Rivers steeti kwukwara na ọ bụ mgbe ndị uweojii mechara nyocha ha ka ya ga-ekwu okwu gbasara mwakpo.
Ọ bụghị Ipob wakporo ma gbuo ndị ugwu bi n'ogbe ahụ
Ọkaiwu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Aloy Ejimako ekwuola na o nweghị mgbe Nnamdi Kanu ji kwuo ka ndị Ipob gbuo onye ọbụla tụmadị ndị Hausa.
O kwuru na ndị otu Ipob anaghị egbu ndị mmadụ makana ha na-akpọ ya ihe nsọ.
Ejimako kwuru na ihe Kanu kwuru bụ ka ndị Ipob chekwa ndụ ha ma a bịa igbu ha.
N'okwu ya, 'O nweghịkwa ndị Ipob na-egbu ndị Ugwu n'Oyigbo, ọ bụ mbochị ọnụ ka ha na-ebochi ha."

O kwuru na ihe abụ atụmaatụ a na-achị wepụta ka ndị ugwu wee gbuwe ndị Igbo bi na bee ha.
Alloy kwuru na Kanu akpọghị ndị Fulani maọbụ ndị Hausa asị kama na ndị ọ na-ewesara iwe bụ ndị na-emegbu ndị Igbo.
Ihe onyeisi ndị ugwu bị na Oyigbo gwara BBC Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị ugwu bi n'ọdịda anyanwu Naịjirịa nakwa Oyigbo bụ Musa Saidu ekwuola na ọ bụ okwu ndị otu Ipob batara ebe ndị Hausa bi n'Oyigbo gbuo mmadụ anọ.
Mgbe anyị jụrụ ya, kedụ ka o si mata na ọ bụ ndị Indigenous People of Biafra gburu ndị bee ha, o kwuru si na mgbe Nnamdi Kanu kwuru na ha ga-emegwara ihe mere n'Emene, na ọ bụ ndị ugwu ka ọ na-agwa.
Mana ndị uweojii na-ekwu na ha amaghị kpọmkwem ndị wakporo ogbe ndị awụsa ahụ.
Saidu kwuru na ọ bụ kamgbe Buhari malitere ọchịchị n'afọ 2015 ka ndị otu Ipob bidoro wakpowe ndị bee ha bi n'Oyigbo ma na-ekwu na nke ga-eme ya ugboro ise ha na-awakpo ndị bee ha.
N'okwu ya, "mgbe ọ bụla ndị Ipob gagharịrị n'ogbe maka ncheta emume nwereonwe ha, ha ga-awakporiri ndị ugwu bi n'ogbe ahụ."
'Mmadụ anọ nwụrụ na mwakpo Ipob mere ndị bee anyị n'Oyigbo' - Saidu
Saidu kwuru na ụbọchị satọde bụ Sepụtemba 5 ka ndị Ipob wakporo ndị ugwu anọ na-azụ ahịa, gba ha egbe mana mmadụ abụọ n'ime ha nwụrụ ozugbo.
O kwuru na ụnyahụ bụ ụbọchị Sọnde, Sepụtemba 6, na ndị otu Ipob bere ndị bee ise mma mana mmadụ abụọ nwụrụ nke mere ya ka ọ bụrụ mmadụ anọ nwụrụ na ngwụcha izuụka a.
O kwuru na ọ gwala ndị ugwu bi ebe ahụ ha nọrọ jụụ makana ọ ma na ndị Igbo anaghị achọ okwu mana ọ maghị ihe mere ndị Ipob ji wakpo ha makana na ha achọ nwereoinwe ha.
O kwuru na ọ bụrụ na nwakpo a gawa n'ihu na ọ gwala ndị bee ha ka megwara.
'A mabeghị maọbụ ndị Ipob wakporo ogbe ndị Hausa bi na Rivers state' - Ndị uweojii

Omoni Nnamdi bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivers steeti ekwuola na ha na-enyocha ka ha mara ndị omekome gara gbuo ndị mmadụ n'ogbe ndị Hausa dị n'Oyigbo, Rivers State.
Nke a na-abịa dịka asịrị na-efegharị n'elu n'ala, ọ kachasị na soshal midia, na ọ bụ ndị otu Ipob kpara arụ ahụ.
O kwuru na ka ihe si kwụrụ ugbua, udo abiaghachila n'ogbe ahụ.
O kwuru na ha anwụchiela ụfọdụ ndị a na-eche na ha kpara mkpamkpa ahụ ma zipukwa ụfọdụ ndị ọrụ ha ka ha chee ogbe ahụ nche.
Ọ bụ ndị Ipob kpara mkpa mkpa a dịka e si ebo ha ebubo?
Omoni kwuru na okwu ahụ esighị n'aka ndị uweojii kama na nnyocha ga-egosi ma ọ bụ ndị Ipob wakporo ogbe ahụ ma na-egbu ndị mmadụ ka ọbụghị ha.
Mana ugbua ọ ka bụ kepukepu na ọ bụ ndị Ipob.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye ọbụla ji aha Ipob na-akpa arụ nọ na nsogbu makana otu ahụ bụ otu iwu machiri.
Kedụ ka o si mee?
Omoni kwuru na ndị amaghị ndị ha bụ ji ọgba tum tum garuo obodo ahụ (Oyigbo) ebe ndị Hausa bi ma bido gbuwe ndị mmadụ n'ụtụtụ Sonde , ụbọchị isii nke ọnwa Sepụtemba.
O kwuru na ha ka na-eme nyocha site enyemaka ndị isi obodo ahụ , onyeisi okpuruọchịchị ahụ nakwa ndị bi n'ogbe ahụ imata maka ihe mere ebe ahụ n'ezie ka ọ ghara ime ọzọ.
N'uche ya , a na-eje n'ubi ọka a na-aka.









