Gọvanọ Okezie Ikpeazu akpọghị IPOB otu oyiegwu- Abia State

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, John Okiyi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọọmentị Abia steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị nke sị na gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu kwuru na ya achọghị ndị oyi egwu bụ Ipob na steeti ya bụ asi.

Ọnụ na ekwuchitere gọọmentị Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka kwuru na ọnweghị mgbe Ikpeazu jiri kwuo ụdịrị okwu a ma ọ bụ na nzụzọ ma n'ịhu ọha mmadụ.

O kwuru sị na dịka ọnụ na ekwuchitere Abia steeti ma sị na enweghị mgbe Gọvanọ Abia steeti jiri kwuo ụdịri okwu a.

Ememanka kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ajụrụ ajụ oge emere ntụlịaka bidoro akụkọ ụgha a.

O kọwakwara na ndị ndọrọndọrọ ọchịchi a bị na Legos steeti ma sị kwa na ụche obi ha bụ ibute ọgbaaghara na Abia steeti.

Na Benue Steeti

Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị Benue bụ Shehu Tambaya akpọkuola gọọmetị etiti ka ha hapu ịkpọlata ndị agha na-echekwa ebe dị iche iche na Naijirịa.

Tambara kwuru nke a ma sị ọkachasị Benue steeti ebe ndi mmadụ bi na ogige gbata gbata maka nwakpo ndị ọchi ehi na awakpo ha n'ime obodo.

N'Ofesi

Nwakpo 'West Gate' mall n'afọ 2013

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụkwa otu Alshabab wakpro ọdọ ahia 'West Gate' were gbuo mmadụ iri isii na asatọ n'afọ 2013

Ndị oyi egwu bụ Al shabaab awakpoola ọgịge ndị agha Kenya na nke mba Amerịka dị na Obodo Lamu na Kenya.

Ha mebiri otutu ụgbọelu na ụgbọala tupu ndị agha mba Kenya were chụpụ ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'egwuregwu

Ndị otu Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otutu ndị ọhụrụ ka Liverpool ji gbaa asọmpị a

Na FA Cup taa; Ndị otu egwu bọọlu Chelsea achịrila aja nwunye ndị Nottingham forest n'ọnụ dịka ha jị ọkpụ goolu xxx asataghị ma ncha were merie ha na asọmpị FA cup ebe Liverpool ji otu ọkpụ goolu were kpaa ndị otu Everton Eze.

Akụkọ ga-amasị gị