Aka DSS akparala onye 'meputara' ihe onyonyo ụgha maka agbamakwụkwọ Buhari

Ebe foto si, Twitter
Ngalaba uweojii akpọrọ "Departmant of State Security" (DSS) na Bekee akpụpụtala ọtụ nwoke dị afọ 32 ha si bụ aka rụpụtara ihe nkiri ụgha iji gosi agbamakwụkwọ Onyeisiala Muhammadu Buhari na Minista na-ahụ maka ego nakwa nke na-ahụ maka enyemaka.
DSS sị na Kabiru Mohammed si Kano steeti, nọ n'aka ha ugbua na-azara ọnụ ya.
Peter Afunanya bụ ọnụ na-ekwuru DSS sị na ọ bụ Minista na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed wetere mkpesa ha jiri nwụchie nwaamadị a.
Ọ gakwara n'ihu dụọ ndị mmadu ọdụ maka imepụta nakwa ikesa akụkọ ụgha.
Ihe Buhari kwuru maka ndị e gburu na Kogi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu ihe ruru mmadụ iri na itoolu ndị ojiegbe gbagburu n'obodo Tawarị dị na Kogi steeti.
O kwuru sị na enweghi ihe kwesịrị ime ka mmadụ were ndụ onye ọzọ, ma kwuo na igbuo m gbugwara na-eme ka ọgụ na mgba kawanye njọ kama idozi okwu.
N'ofesi,
Ndị mba Ịran amalitela akwamozu ọchịagha Qasim Soleimani nwụrụ ka ogbunigwe na-efe n'elu tụrụ ya na Baghdad.

Ebe foto si, AFP
Ndị ntaakụkọ nọ ebe ahụ sị na ụfọdụ na-akwa akwa arịrị, ebe ụfọdụ na-ewe ezigbo iwe dịka ha na-eche ka e bulata ozu nwa amadị ahụ.
N'Ịrak kwa, gọọmentị mba ahụ na-ekwu na akụkọ si na mba Amerịka tụrụ ogbunigwe ọzọ gburu ndị agha ofufe Shia abụghị eziokwu.
Ụlọ ntaakụkọ Frans 24 dekwara na ndị agha Amerịka nọ Irak si na onweghi ihe dị etua ha mere.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, AFP
Kepu kepu si n'ọgbọegwuregwu apụta na-akọwa na Toni Kroos na-agbara Real Madrid bọọlụ, nwereike igafete Manchester United.
Akụkọ ahụ na-ekwu na otu abụọ ahụ na-akpa ka Madrid kpọrọ Paul Pogba ma nye ha Kroos.
Briten atụọla ụmụ Naịjiria nga
Mba Briten atụọla ụmụokorobịa Naịjirịa anọ zokpuru ma si n'ụgbọmmiri mịbata n'ala ha, nga afọ asaa, ka ụlọikpe nyochachara ha.
N'ime ha niile bụ ndị a nwụchiri n'ọnwa Disemba 2018, abụọ anwabuola isi n'ụgbọmmiri agbafu, ebe otu n'ime ha ji ụmụ abụọ ka nwara isi Naịjiria gbaga mba ofesi, tupu aka akpara ha.
Ogbunigwe na-efe n'elu atụgbuola mmadụ isii

Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru mmadụ isii anwụọla na mba Irak dịka Amerịka zipuru ogbunigwe na-efe n'elu ọzọ kwesịrị ịga zute ọchịagha ọzọ n'ụgbọala.
Nke a na-eme ka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kọwara ihe mere o ji gbuo ọchịagha mba Ịran bụ Qasem Soleimani na mba ahụ.
Trump kwuru na ọ bụ makana Soleimani nọ na-akpa nkata etu ọ ga-esi awakpo ma gbuo ụfọdụ ndị mba Amerịka.
Man Utd a ga-aza aha taa?

Ebe foto si, Getty Images
Nkịta ọhịa bụ Wolverhampton ọ ga-atagbu Manchester United mgbe ha ga-ezute n'Iko FA taa?
Ajụjụ a na-abịa dịka Man Utd riri aja nsuru ọkụ n'aka Arsenal mgbe ha zutere na Premier League abalị atọ gara aga.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











