Police Recruitment: Ọnụọgụgụ ndị Ọwụwa Anyanwụ kacha dị nta na ndị a ga-ewe n'ọrụ

Ebe foto si, NPF/Twitter
Ngalaba gọọmentị Naijiria na-ahụ maka nhazi na nlekọta ndị uweojii nke a kpọrọ 'Police Service Commission' eweputala aha ndị ahọpụtara ga-aga nnyocha ikpeazu maka iwe ha n'ọrụ uweojii n'afọ 2019.
Dika ngalaba ahụ depụtara na webụsaitị ha ụbọchị Tọọzdee, mmadụ dị 210,150 bụ ndị ga-esonye na nnyocha ahụ.
Mana n'ime ndị a, naanị mmadụ dị 5,566 ka e siri na steeti Abịa, Anambara, Ebọnyi, Enugwu na Imo steeti bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ (South East) wee họrọ.
Nke a bụ ọnụọgụgụ kacha nta na mpaghara isii e nwere na Naijiri nke gụnyere 'North Central', 'North-West', 'North-East', 'South-South' nakwa South-West.

Iji maa atụ, ndị a họọrọ nanị na steeti Kaduna di mmadụ 12,297.
Nke a karịrị mmadụ niile a họọrọ na steeti ise nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.
Ndị a họrọ nanị na mpaghara North West karịrị ọnụọgụgụ mmadụ nile a họrọ na mpaghara South West, South South nakwa South East.
Gini kpatara nke a?

Ebe foto si, AFP
Emeka Monye bụ onye ihe gbasara ọrụ nchekwa doro anya gwara BBC Igbo na ọ bụghị iwu na ndị niile aha ha pụtara ugbua bụ ndị a ga-ewe n'ọrụ.
Monye kọwakwara na steeti niile nwere ọnụọgụgụ mmadụ ole a ga-esi ebe ahụ were.
Ọ gakwara n'ihu kọwaa na o nwere ike bụrụ maka na ọnụọgụgụ ndị si mpaghara Ugwu tinyere akwụkwọ ka e wee ha n'ọrụ karịrị nke ndị ndịda.
O kwuru sị, "ebe ọ bụ ndị ga-anọ n'ọkwa 'constable' ka a na-ewe ugbua, ọtụtụ ndị si ndịda Naijiria agaghị achọ itinye akwụkwọ n'ihi na ụgwọ a na-akwụ ndị 'constable' dị nta".
Monye kwukwara na onwekwara bụrụ mmegide ka gọọmenti na-emegide ndi bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ, mana a ga-amata nke ọma ma e wepụta aha ikpeazụ ndị a ga-ewe n'ọrụ.

Ebe foto si, AFP
Mana Goddy Uwazuruike, onye ọkaiwu bụrụkwa onye bụbu onyeisi Aka Ikenga, kwuru na ọ bụ mmegide ka gọọmentị etiti na-emegide ndi ọwụwa anyanwụ Naijiria.
Uwazuruike kwuru na "mmegbu gọọmentị etiti Naijiria na-emegbu Ndigbo buru ibu mana ọ gaghị eme ka obi jụọ Ndigbo oyi."
Nyocha ikpeazu nke a ga-eji họpụtazie ndị a ga-ewe n'ọrụ uweojii nke afọ 2019 ga-amalite n' abalị mbụ nke ọnwa Julai,2019.
Akụkọ ga-amasị gi:









