Nigerian Education: 'O nweghi nwata Naịjirịa ọbụla ga-agbahapụ agụmaakwụkwọ'
Akụkọ dị mkpa ụbọchị Juun 27, 2019:
Onweghi nwata Naịjirịa na agaghị agụ akwụkwọ - Buhari

Ebe foto si, @Mbuhari
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọchịchị ya ga-ahụ na o nweghị nwata Naịjirịa ga-agbahapụ ịgụ akwụkwọ n'ime afọ anọ ọzọ.
N'ozi o wepụtara na Twitter ya, o kwuru na ya na gọọmentị Steeti ga-agbakọta aka ọnụ hiwe ụlọakwụkwọ, ndị nkuzi na usoro e ji akụzi ihe n'ụlọakwụkwọ ndị a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Obodo Anambra East etiela mkpu maka ahụike ha

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Ndị mpaghara Anambra-East akwaala arịrị n'ihi enweghi ndị ọrụ ahụike n'ụlọọrụ ahụike ha dị icheiche ma rịọ ka e zitere ha ndị dọkịta ji otu afọ efe ala nna ha.
Ha rịọrọ nke a site n'ọnụ onyeisioche ha bụ Orji Okafor n'emume ọpụpụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha e zitere ebe ahụ.
Okafor kwuru na ha nwere ụlọọrụ ahụike dị iri abụọ na otu mana o nweghị otu onye dọkịta ha nwere nakwa ụlọ nnyocha.
O kwuru na ndị nọọsụ anọ ha nwere a rụgbuola onwe ha n'ọrụ dịka ha anaghị enwe ezumike ọbụla.
Ọkwọụgbọelu anwụọla dịka ụgbọelu dara n'ike

Ebe foto si, TASS/Getty Images
Ọkwọụgbọelu abụọ nwụrụ, ebe mmadụ iri atọ na atọ merụrụ ahụ dịka otu ụgbọelu Angara dara n'ike n'ọdọụgbọelu Nizhneangarsk dị na mba Russia, kpọkasịa ma nwuru ọkụ, dịka ozi si na ngalaba mgbasaozi nke gbatagbata mba ahụ siri kwuo.
Otu onye na-ekwuru gọọmentị mba ndị ọrụ gọọmenti kwuru na ọ bụ otu obi ụgbọ(engine) ụgbọelu ahụ nyụrụ ọkụ, nke mere ka ọkwọụgbọ ahụ ji kpebie ịlaghachi n'ọdọụgbọelu.
Dịka ụlọ ntaakụkọ Reuters siri kwuo ụgbọelu ahụ bu mmadụ 48 gụnyere ndị ọrụ ụgbọelu ise gbafere ebe kwere ọ ga-efetu ma sukanye isi n'ụlọ nwuru ọkụ.
Ihe onyonyo onye nọ n'ime ụgbọelu ahụ sere gosiri ka ya bụ mbiti siri kwee nakwa ka ndị mmadụ si eti mkpu.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
N'asọmpi Iko Mba Afrịka nke taa, Mba Burundi eburula onwe ha laa dịka Madagaska ji otu ọkpụ merie ha.
N'aka nke ọzọ, Senegal na Ọọjerịa ga-adobiri ya iji mara onye ga-abụ onye mbụ n'otu ha ebe Kenya na Tanzania ga-asọkọtakwa mpi.
Anyị achọghị Ruga - Ohanaeze, Afenifere na ndị ọzọ

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ohaneze, Afenifere na otu ndị ọzọ apụtala kwuo na ha achọghị atụmatụ RUGA nke Gọọmenti etiti chọrọ iweputa iji nye ndị Fulanị na-achị ehi ala n'Ọdida Anyanwụ.
Dịka ha na-ekwu nke a, ndị okorobia nke Benue Steeti mere ngagharị iwe igosipụta na ha achọghi atụmatụ Ruga na Benue Steeti ma ọlị ụnyịa hu.
Kama Gọọmenti na-ekwu si na atụmatu a ga-egbochi ogbugbu mmadụ mana otu ndị a sị na nke a bụ asị ọcha
N'Imo Steeti,

Ebe foto si, Facebook/Ihedioha
Gọọmentị Emeka Ihedioha eboola Gọọmentị Rochas Okorocha ebubo na ha zuru akụnụba ruru ijere naira iri ise.
Gọọmentị Imo sị na ngazi, ụgbọala, akwa mpio na nke akwa so n'ihe e zuru.
Rochas ekwuola ka gọọmentị Imo gbaa ihe ha sị na omere n'anwụ
N'Ofesi

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ndị chọrọ iji ọkọlọtọ pati Democrat zụọ ọkwa onyeisiala na mba Amerịka mere nrụrịta ụka nke mbu ha ụnyaahụ.
Ha dị madu 10 n'ime madu 25 mere nruritauka a unyia.
Ka o si dị, ha niile kwenyere na oruola mgbe a ga-eji wepụ Donald Trump n'oche ọchịchị mba ahu.
Nkea bụ maka nkwado ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala mba USA na afọ 2020.
N'Azụmahịa

Ebe foto si, Reuters
Ọnụọgụ si ụlọ ahịa eBay na-egosi na ihe ruru mmadụ otu puku na nari atọ kpatara otu nde "Pound" n'ọgba ahia ahu n'ime otu afọ.
Dịka ọ dị ugbua, enwere mmadu otu puku nke mba Briten kpatara ego ruru otu nde "Pound" n'ọgba ahia eBay.
Ngwaahia kachasị aga ahia bụ uwe, igwe Kọmputa na ngwa ụlọ.
N'Eguwergwu,

Ebe foto si, AFP
Ijipt esorola Naịjirịa gafee ịgba agba nke abụọ Iko Mba Afịrika
Ọkpụ goolu abụọ asataghị ha ji merie Mba Congo DRC nyere ha ohere a.
Ọ bụ Ahmed Elmohamady nyere goolu nke mbụ ebe Mohamed Salah nyere nke abụọ.
Ndị egwuregwu Ijipt ga-ezute ndị mba Uganda na-agba nke atọ n'ụbọchị Ụka bụ abalị iri atọ nke ọnwa Juun 2019.
Gee nkeji a ebe a:
Ihe nkiri anyị nke taa:
Akụkọndị ọzọ ga-amasi gi:










