Miyetti Allah: Ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ asaala okwu ha

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
BBC Igbo gbalịrị ịnụ olu gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ gbasara akụkọ Miyetti Allah ịchekwa ọwụwa anyanwụ.
Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi n'Anambra zara anyị sị: "Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, elebaa ya anya tupu a mara ihe a ga-eme ya."

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
O kwukwara na ọ bụrụ ndị Fulani bi n'Anambra na gọọmentị dị nkwadobe ịlebanye okwu ahụ anya.
Ọ sị; "Ọ bụghị okwu a ga-akpa n'igwe mgbasaozi, ha chọọ ya ha detara anyị akwụkwọ.".
N'Abia steeti

Ebe foto si, @okezieikpeazu
Ogbo ya n'Abịa steeti bụ ọnụ na-ekwuchitere Okezie Ikpeazu kwuru sị:
Na gọvanọ ekwuola na o nweghi ndị Miyetti Allah maọbụ Fulani ga-eche nche n'Abịa steeti
O kwuru na Abia steeti agaghị akwado ya bụ atụmatụ n'ụzọ ọbụla.
N'Ebonyi steeti

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
N'Ebonyi steeti, Emmanue Uzor gwara BBC Igbo na Ebonyi nwere ndị nchekwa bụ ndị uweojii, ndị agha na ndị nchekwa obodo.
Ụzor na-elekọta mgbasaozi na steeti ahụ kwuru na udo adịla n'Ebonyi nke mere na ha achọghị enyemala ọbụla n'ebe ahụ.
N'ọnụ ya "Gọọmentị agwala ha chọpụta ndị ajọ mmadụ n'ime ha kpụpụtara ndị uweojii ka ha rụọ ọrụ ha."











