PDP: "Buhari nwuchie onyeisi Miyetti Allah taa!"

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O nweighị okwu ike pụtara n'ọnụ Buhari gbasara ndị Miyetti Allah ruo ugbua

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ "Peoples Democratic Party (PDP)" ekwuola na ha na-enye onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari elekere iri abụọ na anọ ịjị nwụchị onyeisi otu ndị na-achị ehi n'ala Naịjirịa nke akpọrọ "Miyetti Allah Cattle Breeders Association."

Ha kwuru na ha nyere iwu a kpụ ọkụ n'ọnụ maka mmaja ha majara Bukola Saraki.

Cheta n'ụnyaahụ akụkọ kwuru na onyeisi otu Miyetti Allah na Benue steeti bụ Garius Gololo kwuru ka Saraki ritue n'ọkwa dịka onyeisi ndị ụlọomewu sineti maọbụ ha kwapụ ya.

N'akwụkwọ ozi Kola Ologbondiyan bụ ọnụ na-ekwuchiri otu PDP zipuru ndị ntaakụkọ taa, o kwuru na okwu a gosiri na Miyetti Allah na otu ndọrọndọrọ APC na-egbunye n'otu akpa.

Ologbondiyan kwusi ike na ihe a gosi na ọ bụ otu a na-amụpụta mkpa mkpa dị iche iche na-eme n'ime steeti dị iche iche na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Onye na-akwa ozu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ruo ugbua onweghi ndị a jidere na ha bụ ndị gburu ọtụtụ mmadụ na Benue steeti na ebe ndị ọzọ

O bokwa otu a ebubo na ha nwere ndị na-akwado ha n'ime otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche na Naijirịa.

Cheta n'oge garaga, ndị kpụ okwu n'ọnụ n'ala Naịjirịa kwuru na nkịtị Buhari gbachiri otu Miyetti Allah na-agbagwoju anya mmadu niile dịka ya bu Buhari na-akwado emume niile pụtara n'aka otu Miyetti Allah.

'Aka anyị dị kwa ọcha'

Mana otu Miyetti Allah esepụla aka na ụkwụ n'ihe niile gbasara okwu a Gololo kwuru.

N'akwụkwọ ọzị ha zipuru, ha kwuru na Gololo ga-ata ahụhụ maka okwu a o kwuru.

Ha kwukwara na ha na-eji ohere a na-agwa onyeọbụla na Miyetti Allah abụghị otu na-ekwuchiri ndị na-achị ehi niile na Naịjirịa ọnụ. Ihe pụtara na ogbugbu mmadụ na-eme na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa esịghị n'aka ha pụta.

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Third mainland: Anyị ga-ata ahụhụ