Obidigbo: Napụnụ ndị ọchị-ehi egbe

Onye zọburu ọkwa Gọvanọ Anambra steeti bụ Chike Obidigbo agwala gọọmenti ala Naịjiria ka ha napụ ndị niile na-achị ehi egbe ozigbo ozigbo, iji were kwụsi ndu ndị mmadu ha na-ala n'iyi.
Obidigbo kwara arịrị n'ọgụ na igbu mmadu na-aga n'ihu n'ala anyi ga-ekewa Naijiria n'oge na adịghị anya ma ọ bụrụ na gọọmenti kachie ntị hapụ ndị a kpọrọ onwe ha ndị Fulani na-achị ehi ka ha buru egbe na mma.
Ọ kọwara na ndị na-akpa ike a ji aha ndị ọchị ehi na-emechi na ha bụ ndị e goro ego ka ha bịa tisaa Naijiria.
Obidigbo nyere goomenti ndụmọdọ ka ha were ngwa ngwa nasịsịa onye ọbụla na-achị ehi egbe na mma ma takwa ndị niile dara iwu ala anyị ahụhụ na agbanyeghi agbụrụ onye si.
O kwuru na ya aghọtaghị ihe mere na onwebeghi onye ọchị-ehi atara ahụhụ ka mgbe ha gburu ndị mmadụ na obodo dị iche iche dịka Benue,Kogi, Enugu, Abia,Kogi na ndị ọzọ.
Ihe na-ebutekari ọgụ a bụ na ndị ọchị-ehi na-achiba ehi ha n'ugbo ndị mmadụ ka ọ ga tachasia ihe a kọrọ n' ugbo, nke mere na esemokwu na-adaputa mgbe niile.

Akụkọ ga-amasị gị:





