IGR: Anambra, Akwa-Ibom so na steeti pekarịrị

Ebe foto si, AFP
Ego steeti iri atọ na otu nwetara n'onwe ha ke a kpọrọ 'internally generated revenue(IGR)' na bekee, ji pasentị 12 gbalitere n' afọ 2017, ebe ego steeti ise gụnyere Anambra, Akwa-Ibom , Osun na Taraba kụrụ afọ n'ala n'ihe gbasara ego steeti ọbụla na-akpata n'onwe ya n'afọ.
Ngalaba na-ahụ maka ọgụọgụgụ nke a kpọrọ 'National Bureau of Statistics (NBS)', kwuru nke a n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Fraide sịrị na ego nke ndị steeti nwetara n'afọ 2017gbalitere rue N931.23bn, ebe ọ bụ N831.19bn afọ bụ ya ụzọ, nke naegosi ndịiche N100.04bn.
NBS kwukwara na e nwetara N432/65bn na ọkara abụọ nke afọ 2017(H2 2017), ebe N409.09bn bụ ihe e nwetara n'ọkara mbụ nke afọ ahụ.
Ego nke gọọmenti etiti nwetara n'afọ bụ triliọn N1.73 ebe steeti ketara triliọn N2.67.
Mana ụgwọ eji ndị mba ofesi kwụ na ijeri dọla 19.9, ebe ụgwọ ejị na ụlọ bụ trịliọn N3.35 ka afọ 2017 kwụchara.
Akụkọ ga-amasị gị:





