Otu nwaanyị egbuola ụmụ ya ise

Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe mba France tụrụ Romana Canete, onye dị afọ ịrị atọ na asaa, mkpọrọ maka iji mmiri gbagbuo ụmụ ya ise oge ọ mụrụ ha ọhụrụ ma tinye igbe njụoyi nke a kpọrọ 'freezer' na bekee.
Canete , onye na-ebe akwa na arịọ mgbaghara n'ụlọikpe na Bordeaux, dị na ọdịda-anyanwụ France kwetara na ya mụrụ nwa n'ime ihe eji asa ahụ ma hapụ ụmụaka ahụ ka ha nwụọ n'ime mmiri.
Mgbe nwaanyi ahụ na-ekwu okwu n'ụlọ ikpe, o ji anyamiri sị: " Na mbụ ana m arịọ ụmụaka ọhụrụ m ka ha gbaghara m. Aga m enwe ike ịga n'ebe a na-eli ozu ma pụta na mkpọrọ gai rịọ ha mgbaghara.
"Ana m arịọkwa mgbaghara n'aka ezinaụlọ m, ụmụ ndị nwaanyị ndị bị na-edi ihe ụfụ nke a."
O kwukwara sị: "O nweghị ihe ọzọ m hụrụ mee. A chọghhị m ime ndị ahụ. Mụọ m juru ụmụaka ahụ."
Ọ bụ otu n'ime ụmụ Canete abụọ na-eto eto hụrụ nwa ekechiri n'ime aka nime igbe njụoyii.
Dịka akwụkwọ akụkọ AFP siri kwuo, ndị uweọjịị mechara hụ ọzu ndị ọzọ ka di nwaanyị ahụ kpọchara ha.
Nchọpụta a pụtara ihe n'ọnwa Maachị afọ 2015, ma Romana anọla afọ atọ na mkpọrọ.
Akụkọ kwuru na ọmụmụ na ọgbugbu ụmụaka ndị ọzọ mere afọ iri tupu nke chịpụtara nwaanyi ahụ ụkwụ n'ama.
A na-ele anya na nwaanyị ahụ agaghị anọcha afọ asatọ n'ụlọnga, na ọ ga-anọ afọ ise n'aka ndị nlekọta ma a tọhapụ ya.
Di ya bụ Juan Carlos, onye ọrụugbo,kwuru na ya amaghị ma ọlị na nwunye ya dị ime ndị ahụ.
Ndị ọkachamara kwuru na ọkaikpe kọwara nwoke ahụ dịka onye nwere 'oke ekworo' na ebe nwunye ya nọ.
Onye kpere ikpe ahụ bụ Xavier Chavigné, kwuru n'ikpe ahụ lebara anya n'ụdị mmadụ di nwaanyị ahụ bụ.
Akụkọ ga-amasị gị:









