Nwoke mara nwa ya aka ntị

Nwa ọhụ

Ebe foto si, Press Eye

Nkọwa foto, Nwa nwoke ọ dị mkpa karịa nwa nwaanyị?

Otu nwoke aha ya bụ Edet Asuquo agbaala ọsọ maka ihe o mere nwa ya nwaanyị.

Gịnị ka Gift mere?

Nna ya na-ekwu na maka ọ bụghị nwa nwoke, ọ nweghi uru ọ bara. O jikwa maka ya kwuo na ọ ga-egbu ya.

Edet na nne Gift bụ Rosemary Kingsley bụ ndị Kalabar dị na Cross River Steetị bi na Legọs. Ha anubeghi mgbe ha nwere mmekọrịta butere afọ ime. Rosemary kwabara n'ụlọ Edet mgbe ọ muru Gift. Mana obi adịghị Edet mma maka nwata a abụghị nwa nwoke etu o sịrị chọọ. Ihe kpatara esemokwu mgbe ọbụla.

Na Januwarị 10, 2018 Grace bere akwa agụụ, nna ya ama ya ezigbo aka ntị maka ya, nke a mere ka ọdụdọ dọ nwata a. E bụrụ ya gbaraga ụlọ-ọgwụ. Ndị ọrụ ụlọ-ọgwụ gwara ndị ọrụ na-eche ndị nkịtị na Lagos Steeti, ha gwa ndị uwe ojii nọ nso ebe ahụ. Mgbe ndị uwe ojii ruru ụlọ Edet, ọ gbapụla ọsọ kemgbe.

Onye ọrụ na-eche ndị nkịtị kwuru na ọbara si n'ịmị nwata ahụ apụta. Akara na-egosikwa na nti ya ebe.

Ndị uwe ojii ka na-eleba okwu ahụ anya ya.