Ndị uweojii Enugwu anwụchiela nwoke gburu nwunye ya

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwoke a kpọrọ Sunday Nnamani akụgbuola nwunye ya, n'Enugwu, Enugwu steeti.
Akụkọ kwuru sị na izụụka gara aga, Nnamani na nwunye ya bụ Nkechi nwere nghọtahie ebe ọ nọ kunye ya ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma.
E bugara ya n'ụlọọgwụ Parklane Specialist Hospital, Enugu, ebe ọ nọrọ na-enwe nleta tupu ọ nwụọ ụnyaahụ.
Mgbe BBC gbara ya ajụjụọnụ n'ekwenti, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ SP Ebere Amaraizu, kwuru n'ezie na ọ bụ ihe mere eme.
"Ọ bụ eziokwu. Mana ọ bụ izuụka gara aga ka nwoke ahụ na nwunye ya nwere okwu o were ihe kụọ ya n'isi. E buga ya ụlọọgwu ma ọ nwụrụ ụnyaahụ."
Amaraizu gara n'ihu kwuo na aka ndị uweojii Enugwu steeti akparala nwaamadi ahụ, ebe o sokwa enyere ha aka na nyocha ha na-eme maka ọdachi ahụ.
Ka ọ dị ugbua, e tinyela ozu nwaanyị ahụ n'ụlọozu.





