Enwere ihe dị iche n'etiti mmanya nkwụ na mmanya ngwọ?

Mmanya nkwụ
    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

A bịa n'ala Igbo, e nwere mmemme dị iche iche e ji mara ndị Igbo. Mmemme ndị a gụnyere ịgba nkwụ nwaanyị, akwamozu, ichi ọzọ, ịgọ ọfọ, iri ji ọhụrụ wdg.

Mmemme ndị a bụ ohere e ji egosipụta etu e si eme omenala nakwa ọtụtụ ihe e ji mara ndị Igbo.

Mmemme ọbụla a na-eme n'ala Igbo anaghị ezuoke ma ọ bụrụ na mmanya na-aba n'anya adịghị, ọ kachasị mmanya nkwụ na mmanya ngwọ. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ nke gosiri na mmemme a bụ mmemme ndị Igbo.

Mana oge ụfọdụ, a na-enwe ihe mgbagwojuanya ebe mmanya nkwụ na mmanya ngwọ nọ. Ụfọdụ na-ekwu na ha abụọ bụ otu ihe. Nke a mere ka BBC Igbo malite ịjụ ndị o doro anya iji chọpụta nke bụ eziokwu.

Ndị na-agba nkwụ

Onye na-ete nkwụ aha ya bụ Monday kọwaara anyị ihe dị iche, uru nakwa ihe ndị ọzọ banyere mmanya nkwụ na mmanya ngwọ.

"N'ala Igbo, ọ bụ mmanya nkwụ ka e ji eme mmemme, gọọ ọfọ, chụọ afọ nakwa ihe ndị ọzọ e ji mmanya eme. Anaghị eji mmanya ngwọ eme ihe ndị a", ka Monday kwuru.

Ọ kọwara na ọ bụ arụ n'ala Igbo iji mmanya ngwọ gọọ ọfọ maọbụ mee ihe omenala ọbụla.

Kedụ ebe e si enweta mmanya nkwụ na mmanya ngwọ?

Mmanya nkwụ na mmanya ngwọ

N'okwu Monday "Ọ bụ n'osisi nkwụ ka e si enweta mmanya nkwụ ebe ọ bụ n'osisi rafịa ka e si enweta mmanya ngwọ".

Ọ gara n'ihu gwa anyị usoro e ji enweta mmanya ndị a.

"A bịa na mmanya nkwụ, a na-ebu ụzọ gbuchaa elu osisi nkwụ iji nweta ohere ebe a ga-etinye galọnụ e ji echeta ya. Ọ bụrụ na e mee nke a, mmanya nkwụ ga na-atanye n'ime galọnụ ahụ ntakịrị ntakịrị ruo oge o juru maọbụ oge onye na-ete nkwụ bịara wepụ ya", ka Monday kọwara.

N'aka nke ọzọ, mmanya ngwọ anaghị ewe ọtụtụ oge ịnweta maka na ọ na-agbapụta osịịsọ karịa mmanya nkwụ.

Monday kwuru na ọ bụrụ na ọ ga-ewe abalị anọ iji nweta mmanya nkwụ ruru otu ntakịrị galọnụ lita ise, ọ ga-enwe naanị otu abalị inweta mmanya ngwọ ruru galọnụ lita ise.

Kedụ ihe dị iche na mmanya abụọ a?

Mmanya nkwụ

A bịa etu mmanya nkwụ na mmanya ngwọ si atọ, Monday kọwara na otu ihe dị iche na ụtọ mmanya abụọ a bụ na mmanya ngwọ na-atọ shuga shuga ebe mmanya nkwụ adịghị etu ahụ.

Ọzọ bụ na mmanya nkwụ na-egbu egbu karịa mmanya ngwọ.

A bịa na mmemme dịka alụmdi na nwunye, ichi ọzọ, maọbụ mmemme omenala ọbụla, ọ bụ naanị mmanya nkwụ ka e ji eme ya.

Otu ihe ọzọ Monday gwara anyị bụ na ọnụego mmanya nkwụ karịrị ọnụego mmanya ngwọ. Nke a gosiri na mmanya nkwụ na mmanya ngwọ anaghị ama aka.