Gịnị ka mmanya 'herbal bitters' na-arụ na ahụ mmadụ?

Bọtọlụ mmanya mgbọrọgwụ a na-akpọ herbal bitters
Nkọwa foto, Bọtọlụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters
    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Mmanya mgbọrọgwụ nke bekee kpọrọ ‘Herbal Bitters’ nwere ihe abụọ e ji emepụta ya.

Nke mbụ bụ ihe na-elu ilu e mepụtara site na mgbọrọgwụ dị iche iche ebe nke abụọ bụ ihe na-egbu egbu bekee kpọrọ ‘alcohol’.

Mmanya ya bụ nke ọtụtụ mmadụ na-achọ nke ukwuu, nke mere ka ọnụọgụ ya na-amụba n’ike n’ike n’ahịa dị iche iche na Naịjirịa.

Ụfọdụ kwuru na ha na-aṅụ ya maka na ọ bụ mmanya na-aba n'anya ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ọgwụ nye ha.

Dọkịta Tobechi Ozuzu gwara BBC Igbo na ihe mere e ji nwee ọtụtụ herbal bitters juru ahịa ugbua bụ maka na ụlọọrụ NAFDAC enwebeghị ike imachi etu e si arụpụta ya aghara aghara.

"Ọ bụrụ na ụlọọrụ NAFDAC tinye atụmatụ ga-eme ka e mee ezi nyocha tupu onye ọbụla arụpụta mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters, ọ ga-enyere aka belata ọtụtụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters juru n'ahịa Naịjirịa gbaa gburu gburu.

Gịnị mere ọtụtụ ndị mmadụ ji aṅụ ya?

Bọtọlụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters
Nkọwa foto, Bọtọlụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters

Dọkịta na-ahụ maka ime ahụ mmadụ bụ Kodichimma Onwuka kwuru na ọtụtụ ndị na-azụ ma na-aṅụ mmanya herbal bitters kwuru na ọ bụ maka na ọ dị mfe ịnweta ma dịrị ọnụ ala karịa ọgwụ mkpọrọgwụ ọtọdọks ndị ọzọ.

Ụfọdụ kwuru na ha na-aṅụ mmanya mgbọrọgwụ herbal bitters maka na ọ na-arụ ọrụ n'ụzọ dị iche iche.

Ha kọwara ya dịka ezigbo ọgwụgwọ maka ọrịa dị iche iche dị ka afọ mgbu, ahụ ịcha ọkụ, oke ibu, ihe nwoke ji bụrụ nwoke na-anaghị akwụ ọtọ, ọrịa genital tract, wdg.

Dọkịta Onwuka kwuru na ọtụtụ oge ụfọdụ ndị gaa ụlọọgwụ, ha anaghị enweike ịhụ dọkịta maka igurube ndị mmadụ nọ n’ụlọọgwụ n’ihi enweghị ọtụtụ ndị ọrụ ahụike, nke bụ ọgbatauhie n'ọtụtụ mba Africa, ọ bụ nke a mere ha ji anụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters.

N'aka nke ọzọ, Dọkịta Tobechi Ozuzu gbakwụnyere na ụfọdụ ndị ntorobịa na-aṅụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters maka na ha kwenyere na ọ na-enyere aka na mmekọ nwoke na nwaanyị.

O nwere uru mmanya herbal bitters bara n'ahụ mmadụ?

Bọtọlụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters
Nkọwa foto, Bọtọlụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters
Akụkọ ndị ọzọ gbasara etu nri si emetụta ahụike
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

A na-ekwu na mmiri mgbọrọgwụ bara uru n'ihi na ha na-arụ ọrụ dịka aperitifs na carminatives maka ọrịa ịba, ọrịa ahụ ọkụ tyfoid, ahụ ịcha ọkụ, ibu ibu, ihe nwoke ji bụrụ nwoke na-anaghị akwụ ọtọ, ọrịa genital tract, wdg.

Mana Dọkịta Onwuka kwuru na-enweghị nyocha ọbụla gosịrị na mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters dị irè ịrụ ọrụ ndị a niile.

Ọ kọwara na mmanya mgbọrọgwụ herbal bitters anaghị agabiga ọtụtụ nyọcha ọgwụ mmanya mkpọrọgwụ ndị ọzọ na-agabiga tupu arụpụta ya.

“Ọ bụ nke a mere e jiri nwee ọtụtụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters n’ahịa ugbua, nke mere ka ọtụtụ mmadụ na-aṅụ ọtụtụ n’ime ha dị iche iche n'otu oge”, ka Dọkịta Onwuka kwuru.

Dịka akwụkwọ nyocha nke Showande mere n’afọ 2014 si kwuo nke mmadụ 1000 zara, mmadụ dị pasenti 40.9 ṅụrụ mmanya mgbọrọgwụ herbal bitters iji kpochaa ime ahụ ha ebe ụfọdụ ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke ṅụrụ maka igbochi nje ọbụla.

Nyocha ahụ chọpụtara na ụfọdụ ndị ahụ ṅụrụ mmanya mkpọrọgwụ herbal bitters kwuru na ha nwere mmetụta nke gụnyere isi ibu ajụ, enweghi ike ịmata ụtọ nri (loss of taste), ịgbọ agbọ, afọ ọsịsa na ọzịza akụkụ ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Kedụ ihe nyocha sayensi kwuru maka ya

Nchọpụta kwuru na ọzịza akụkụ ahụ sitere n’ịṅụ ọgwụ mgbọrọgwụ bụ nke na-atụ aka na ịṅụ mmanya mgbọrọgwụ herbal bitters nwere ike ibute ọrịa akụrụ.

Dọkịta Onwuka kwuru na kemgbe ọ malitere ịrụ ọrụ n’ụlọọgwụ, e nweela ọtụtụ ndị nwere ọrịa akụrụ ka ha ṅụchara ọgwụ mgbọrọgwụ dị iche iche mana amaghị ụdịrị mgbọrọgwụ ha ṅụrụ.

Nyocha na mmetụta Nephrotoxic na hepatotoxic nke ọgwụ mgbọrọgwụ bụ nke ndị nyocha na-elebanye anya na ya mana nke mmanya mgbọrọgwụ herbal bitters adịghị ukwuu.