World Aids Day: Nri ndị ga-edozi onye nwere nje HIV ahụ

Ebe foto si, Chidinma Njoku
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo
Na mmadụ na-arịa ọrịa HIV abụghị na a maala onye ahụ ikpe ọnwụ dịka ụfọdụ ndị na-eche na ụwa agwụla.
Ihe dịrị onye ahụ ime bụ ịṅụ ọgwụ dịka dọkịta si tụzie aka ma rie ezigbo nri dịka o kwesịrị.
N'emume iji cheta ụbọchị ọrịa HIV nke afọ 2019 a, BBC Igbo kpọtụrụ onye ọkachamara n'ihe banyere nri bụ Amaka Ezeoke ka ọ kụziere ndị mmadụ nri ndị ha kwesịrị ị na-eri.
Ezeoke onye nwe ụlọọrụ 'Nutrifit Wellness and Consult' sị na o nweghi nri pụrụiche ha kwesịrị iri kama na ọ bụ iri ezigbo nri na mgbe o kwesịrị.
Ọ gara n'ihu sị na ụdị nri dịka ndị a ga-enyere onye ahụ aka;
Mkpụrụosisi

Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ị na-aracha mkpụrụosisi nke ọma nakwa n'oge niile, na ọ na-enye aka ibulite vitamin na mineral dị n'ahụ onye ahụ iji buso nje ahụ agha.
Mkpụrụosisi ndị dịka oroma, ọkwụrụ Bekee, apụl, unere, ube, anyụ Bekee dgz, ndị dị mma na-abụghị ndị rere ere.
Akwụkwọ nri

O kwesịrị iri akwụkwọ nri nke ọma na-abụghị nke rere ere maọbụ nke e sigwọrọ esigwọ. Nke na-enyekwa vitamin na mineral n'ahụ.
Akwụkwọ nri ndị a gụnyere ụgụ, tomanto, ọha, onugbu, kukumba na ndị ọzọ.
Nrị ndị e siri n'ọkụ

Ebe foto si, Getty Images
Onye ahụ ga na-eri nri ndị e siri n'ọkụ nke ọma na-abụghị mgbe niile ọ na-eri nri eghere eghe.
Nri ndị a gụnyere osikapa, ji, akwa, nduku, ofe na garrị, akwa, mmiri ara ehi dgz.

Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ kwesịrị ị na-eri nri e siri n'ụlọ ya na-agụkarịghị nke e siri n'ezi ọ zụrụ azụ.
Nke ọzọ bụ na ọ ga-asapụ aka ya ọcha tupu ọ na-eri nri ọbụla ọ chọrọ iri.
Ịṅụ ezigbo mmiri

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ahụ onye ọbụla chọrọ mmiri, etu a ka ahụ onye nwere ọrịa HIV chọkwara mmiri.
Nke a pụtara na onye ahụ agaghị eji ịṅụ mmiri egwu egwu, o nwereike ịṅụkwa ihe ndị ọzọ nwere mmiri dịka mmiri a pịpụtara na mkpụrụosisi nke Bekee kpọrọ 'juice'.
Gbaara nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị (Sugar) ọsọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV ekwesịghị iri nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị makana ọ na-egbu mkpụrụobi onye ahụ.
Belata oke abụba na mmanụ

Ebe foto si, Getty Images
N'agbanyeghi na abụba na-enye ike n'ahụ, ọ bụghị ya mere ka onye na-arịa ọrị HIV ga-eji rie ya nke ukwuu.
O kwesịrị ibelata etu o si eri ya maka ọrịa mkpụrụobi.
Ezeoke gara n'ihu nye ndị nwere ọrịa HIV ndụmọdụ ka ha na-emegharị ahụ kwa mgbe kwa mgbe, makana ọ na-enye aka imezi ahụ.
Ọ sị na nke kachasị mkpa bụ ka onye ahụ ṅụọ ọgwụ ya dịka o kwesịrị, rie ezigbo nri dosa aka ya na onwe ya ọcha ma megharịa ahụ nke ọma.
Na onye ọbụla na-agbaso usoro a ga-enwe ezi ahụike nke na-agaghị egosi na o nwere ọrịa HIV.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










