Mother to child HIV transmission: Ụzọ ị ga-esi gbalahụ ibufe nwa ọhụrụ gị HIV

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ na-ewu na Naịjirịa bụ mba ebe ụmụaka nwere nje HIV site n'afọ nne ha maọbụ mgbe a na-amụ ha kacha n'ọnụ ọgụ, ọ dị mkpa ịme ka ọha na eze mata ka a ga-esi gbochie ụdị ọgbatauhie a.
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochị HIV/AIDS bụ National Agency for the Control of AIDS (NACA) depụtara ihe ndị n'ọbaozi ha.
Ihe ị kwesiri ịmata maka ibufe nwa amụrụ ọhụrụ nje HIV

Ebe foto si, Getty Images
Nje HIV nwere ike ị banye nwa amụrụ ọhụrụ n'ahụ sịte n'ahụ nne ya, mgbe ọ nọ n'afọ, mgbe a na-amụpụta ya maọbụ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya. Ihe a bụ ụzọ ụmụaka si ebutekarị nje HIV.
A na-enye nwaanyị dị ime nwere nje HIV ọgwụ HIV ka ewere gbochie ụmụ ha ibute ya bụ nje.
Mgbe ụfọdụ a na-eyiagba mgbe a ga-awa nwaanyị dị ime bu HIV afọ maka ikupute nwa dị ya n'afọ ka ọ ghara ibute ya bụ nje.
A na-enye nwa nne ya bu ya bụ nje ọgwụ mgbochi ọnwa isii ka amụchara ya.
Na mba ụfọdụ, a na-akwụsị nwaanyị bu nje HIV inye nwa ọhụrụ ha ara maka ibufe ya nje ahụ.
Kedụ ka usoro a si egbochi ibufe nwa amụrụ ọhụrụ nje HIV?
A na-enye nwaanyị dị ime bu nje HIV ọgwụ mgbe ọ dị ime na mgbe ọ mụrụ nwa.
Mgbe ụfọdụ, enwere ike iyiagba mgbe a aga-awa ya afọ kuputa nwa ahụ ka nje ahụ ghara ịba ya ahụ.
Centers for Disease Control and Prevention (CDC) kwụrụ na ọ dị mkpa ịnyocha nwaanyị ọbụla di ime nje HIV ngwa ngwa ọ dị ime.
Nwaanyị ọbụla bu ya bụ nje kwesiri ịmalite ṅụwa ogwu ya ozugbo iji belata ibufe nwa ya nje ahụ.
Ọgwụ ahụ na-enyere ha aka ibite ndụ aka, nwekwaa ahụike ma mekwa ka ọ ghara ibufe nwa ya nje ahụ.
Kedụ ka ọgwụ a si arụ ọrụ a?

Ebe foto si, PA
Ọgwụ a na-ebutu ọnụọgụgụ nje HIV dị mmadụ n'ahụ nke ga-eme ka ọ ghara inwe ike ịba nwa ya n'ahụ mgbe ọ nọ n'afọ maọbụ mgbe ọ na-amụ ya.
Ibuda ọnụọgụgụ nje HIV na-emekwa ka nwaanyị bie ezigbo ndụ n'ahụike.
Ụfọdụ ọgwụ ndị na-esikwa n'afọ nne baa nwa n'ahụ site na mgbiriafọ ya bụ nke Bekee kpọrọ afterbirth.
Ụzọ a na-eme ka nje a ghara ịba nwa ọhụrụ n'ahụ okachasị mgbe a na-amụpụta ya.











