Nigeria vs South Korea: Falcons achakeela ka ugo

Ebe foto si, AFP
Ọgbọ egwuregwu Fransị enwurula ọkụ ugbua dịka Falcons nke Naịjirịa tuuru ugo.
Goolu mbụ Naịjirịa si n'aka ndị Sawụt Korea mgbe Kim Do-yeon gbabara bọọlụ na neetị ha na nkeji 29.
Nke a mere na amalitere nyocha site na Teknụzụ VAR tupu anabata goolu ahụ.
Asisat Oshoala gosiri ndị Sawụt Koria na Naịjirịa abịaghị egwuregwu ụmụaka na nkeji 75.
O ji otu ọkpụ goolu saa ha anya nke mere na Naịjirịa meriri asọmpị ahụ.
N'ikpeazụ, Naịjirịa ji mmeri a gbara isi onwe dịka Norway merichara ha n'asọmpị nke mbụ ha.






