Nigeria vs Norway: Akpọchuola Naijirịa ihu ahị France taa.

Ebe foto si, Reuters
Norway ejirila ọkpụ goolu atọ sị Naịjirịa ndewo n'asọmpị iko mbaụwa ụmụnwaanyi bụ nke amalitere an France taa.
Ụmụnwaanyị Norway gbara bọọlụ ka nwoke ebe ndị Naịjịrịa mere ka nwaanyị ha bụ ruo mgbe a lọtara ezumike ha malitere ịkpọ ganị ganị nke amịtaghị mkpụrụ ma ọlị.
Goolu Norway mbụ nke sị n'ụkwụ Reiten banyere an nkeji iri na asaa (17") ebe nke abụọ banyere na nkeji iri atọ na anọ (34") site n'ụkwụ Utland
Egwu bara Naịjirịa ahụ bụ nke gosiri n'ahụ Ohale bụ nke mere ka onye Naịjirịa goolu nke atọ na nkeji iri atọ na asaa (37").
Ka a na-eme nke a, Naịjirịa jizi mpekere akwụkwọ edo edo site n'aka Francisca Ordega na Desire Oparanozie bụ onye bu ụzọ rite ya bụ akwụkwọ ịdọaka na ntị na nkeji iri na atọ (13").
Norway ji ọkpụ atọ merie Naịjirịa mgbe alara ezu m ike bụ nke Naịjirịa enwetaghị ụsa ya rụọ mgbe egbuchiri ya bụ asọmpi.
Na abalị Satọde a ka Iko mbaụwa ụmụnwaanyị biiri ọkụ na mba France bụ nke Naịjịrịa na mba 24 ndị ọzọ so na ya.
Naịjirịa sọ na ikpo nke A bụ ndị bidoro ya bụ asọmpị na Stade Auguste Delaune dị na France.
Naịjirịa na South Koria ga-ezuta na Wenezde n'elekere abụọ nke ihihie na Stade des Alpes, Grenoble.
Spain ejirilarị ọkpụ atọ asatara oti kpọchuo South Africa ihu ahịa.










