AWCON 2018: Falcons anyụọ Bayana ịkpakwụ

Super Falcons

Ebe foto si, NFF

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Mmeri Super Falcons meriri otu Bayana Bayana nke South Africa emeela ka ha bute iko nke itolu (9) n'asompi AWCON.

Ka nkeji 90 agbazuru bọọlụ, enyekwara ha nkeji iri na atọ ọzọ mana onweghị onye nyere goolu.

Nke a mere ha jiri gbaa penariti bụ nke ndị Super Falcons ji gbajie ha aka napụ ha ya bụ iko ka ha nyere goolu anọ ebe South Africa nyere atọ.

Nke a bụ ugboro 11 agbagoro egwuruegwu a. Naịjirịa jide itoolu ya ebe Equatorial Guinea ji abụọ ndị ọzọ.

South Africa azọọla iko a na-agba nke ikpeazụ ugboro anọ na-achitaghị aja. N'ime ugboro anọ ahụ, ha na Naịjirịa agbaala ugboro abụọ bụ nke Naịjirịa merichara ha.

Abịa n'otu ụmụnwaanyị gbara asọmpi nke 2018 a, ihe karịrị ọkara n'ime ha na-agba bọọlụ na mba ofesi, ebe ndị ọzọ na-agba bọọlụ na Naịjirịa.

N'ime otu a sokwa gaa, a kpọrọ aha mmadụ anọ n'ime mmadụ 15 nwere ike inweta ihe nrite "Nwaanyị kacha agba n'Afrịka" nke 2018.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onye nchịkọta otu Falcons bụ Thomas Dennerby, sokwa na mmadụ ise nwere ike inweta ihe nrite "Onye nkuzi kacha akuzi" nke 2018.

Ndị egwu

Aha onyonyo, Oparanozie: Anyị na-ekpere Super Eagles ekpere

Ndị oche goolu

1) Tochukwu Oluehi

Oluehi na-eyi uwe e dere 1, na-eche goolu na Rivers Angels dị na Rivas steeti na Naịjirịa.

A mụrụ ya n'afọ 1987.

Tochukwu Oluehi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tochukwu Oluehi echeerela Naịjirịa goolu ihe ruru afọ asatọ

2) Christy Udogadi Ohiaeriaku

Ohiaeriaku na-echere ndị Confluence Queens dị na Kogi steeti goolu.

A mụrụ ya n'afọ 1996.

Christy Ohiaeriaku

Ebe foto si, Getty Images

3) Chiamaka Cynthia Nnadozie

Nnadozie na-echere ndị River Angels bọọlụ.

A mụrụ ya n'afọ 2000.

Chiamaka Cynthia Nnadozie

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chiamaka cheere otu Flamingoes nke Naịjirịa goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa ndị dị afọ 17 n'afọ 2016

Ndị na-agba n'azụ

4) Onome Ebi

Ebi na-eyi uwe e biri ise n'elu, na-agba bọọlụ na Henan Huishang dị na mba China.

A mụrụ ya n'afọ 1983.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

5) Osinachi Marvis Ohale

Ohale na-eyi uwe e biri atọ n'elu, na-agba bọọlụ na Vaxjo DFF dị na mba Swidin.

A mụrụ ya n'afọ 1991.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

6) Glory Ogbonna

Ogbonna na-agba bọọlụ na Ibom Angels dị n'Akwa Ibom steeti.

A mụrụ ya n'afọ 1998.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

7) Josephine Chukwunonye

Chukwunonye na-agba bọọlụ na Asarums IF dị na mba Swidin.

A mụrụ ya n'afọ 1992.

6) Josephine Chukwunonye

Ebe foto si, Getty Images

8) Ngozi Ebere

Ebere na-agba bọọlụ na Barcelona FC dị na mba Spen.

A mụrụ ya n'afọ 1991.

Ngozi Ebere

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ebere so n'otu Super Falcons buliri Iko Mba Arịka n'afọ 2016

9) Faith Ikidi Michael

Ikidi na-agba bọọlụ na Piteå IF dị na mba Swidin.

A mụrụ ya n'afọ 1987.

Faith Ikidi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Faith Ikidi malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2004

10) Sarah Nnodim

Nnodim na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti.

A mụrụ ya n'afọ 1995.

Sarah Nnodim

Ebe foto si, Getty Images

Ndị egwu etiti

11) Ngozi Okobi

Okobi na-agba bọọlụ na Eskilstuna United dị na mba Swidin.

A mụrụ ya n'afọ 1993.

Ngozi Okobi

Ebe foto si, Getty Images

12) Anam Imo

Imo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti.

A mụrụ ya n'afọ 2000.

Anam Imo

Ebe foto si, Getty Images

13) Halimatu Ayinde

Ayinde na-agba bọọlụ na Asarum IF dị na mba Swidin.

A mụrụ ya n'afọ 1995.

Halimatu Ayinde

Ebe foto si, Getty Images

14) Rita Chikwelu

Chikwelu na-agba bọọlụ na Kristianstand DFF dị na mba Swidin.

A mụrụ ya n'afọ 1988.

Rita Chikwelu

Ebe foto si, Getty Images

15) Amarachi Okoronkwo

Okoronkwo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa.

A mụrụ ya n'afọ 1992.

Amarachi Okoronkwo

Ebe foto si, Getty Images

Ndị na-agba n'ihu

16) Asisat Oshoala

Oshoala nwetara ihe nrite "nwaanyị kacha agba n'Afrịka" nke afọ 2017, ma bụrụkwa onye kacha gbakpuo bọọlụ na neetị n'Iko Mba Afrịka nke 2016.

Ọ na-agba bọolụ na Dalian Quanjain FC dị na mba China.

A mụrụ ya n'afọ 1994.

Skip Instagram post, 3
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 3

17) Desire Ugochi Oparanozie

Oparanozie malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2010. O nwetara ihe nrite boot ọlaedo a na-enye onye kachasị nye goolu nke asọmpi AWCON e mere n'afọ 2014.

Ọ na-agbara otu Guinamp dị na mba Frans bọọlụ.

A mụrụ ya n'afọ 1993.

Skip Instagram post, 4
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 4

18) Francisca Ordega

Ordega na-eyi uwe 17, na-agba bọọlụ na Washington Spirit dị na mba Amerịka, mana ezigara ya Atletico Madrid na mbinye.

Ọ nọchitela anya Naịjirịa n'asọmpi ndị na-agafeghị afọ 17 nakwa nke ndị na-agafeghị afọ 20.

O so Naịjirịa bulie iko atọ n'afọ 2010, 2014, 2016.

A mụrụ ya n'afọ 1993.

Skip Instagram post, 5
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 5

19) Rasheedat Ajibade

Ajibade na-agbara FC Robo dị na Legọs steeti bọọlụ.

O nwetara ihe nrite "onye kachasị gbaa ọfụma" n'egwuregwu Naịjirịa na Kanada oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016.

A mụrụ ya n'afọ 1999.

Skip Instagram post, 6
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 6

20) Chinwendu Vera Ihezuo

Ihezuo na-agbara BIIK Kazygurt dị na mba Kazastan bọolụ.

O nwetara ihe nrite "onye kachasị gbaa ọfụma" n'egwuregwu Naịjirịa na Spen oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016.

A mụrụ ya n'afọ 1997.

Chinwendu Vera Ihezuo

Ebe foto si, Getty Images

21) Chinaza Uchendu

Uchendu na-agbara ndị Sporting club de Braga dị na mba Pọtugal bọolụ.

A mụrụ ya n'afọ 1997.

Skip Instagram post, 7
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 7

Onye nchịkọta

Thomas Dennerby malitere ịchịkọta otu Super Falcons n'ọnwa Jenụwarị nke 2018.

Ọ bụbu onye nchịkọta otu egwu ụmụnwaanyị mba Swidin.

Thomas Dennerby

Ebe foto si, Getty Images

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ