Nigerian Security: Ndị 'Ụkọchukwu Alakụba' bu egbe apụtala na Sokoto

Aha onyonyo, Ihe onye hụrụ kwuru maka ndị batara Naịjirịa

Otu ọhụru sị na ha na-akuzi usoro alakụba ma na-ebu egbe apụtala na Sokoto Steeti, n'ugwu Naịjirịa.

Sokoto na Mba Niger nwere oke ala.

Otu onye bi n'okpuruọchịchị Tangaza LGA na Sokoto Steeti ya na BBC kwuru okwu, sị na ndị a batara ụfọdụ ime obodo ọnwa abụọ gara aga.

Nwoke a rịọrịọ BBC ka aha ya ghara ịpụta maka nchekwa ndụ ya, kwukwara na ndị a na-aba obodo dị iche iche na-anata ụtụisi ndị alakuba nke akpọrọ "Zakkah".

Ha na-apịakwa ndị akwụghị ụtụisi a ụtalị.

Nwoke a sịkwa na ndị otu a ruru 200, nke ụfọdụ n'ime ha bụ ndị dịka ndị ọcha nakwa ndị Arab, na-ekpuchi isi ma na-ebu egbe ukwu.

Dịka nwoke a si kwuo, ndị a na-eduba ndị ntoroobịa ọhịa na-akụzịrị ha ihe dị iche iche, ha lọta ha ebunye ha ọgbatumtum.

Aminu Waziri Tambuwal

Ebe foto si, Aminu Waziri Tambuwal

Nkọwa foto, Aminu Waziri Tambuwal bụ aka na-achị Sokoto Steeti

Makana okpuruọchịchị Tangaza dị nso mba Niger, ọ na-adị mfe ka otu a na-enwe ohere ime ihe ha na-eme ebe ahụ ugbua.

Akụkọ a na-eme ka ndị mmadụ na-atụ ụjọ na mpaghara a, mana ndị ọrụ nchekwa obodo etinyebeghi ọnụ n'ihe a na-eme.

Otebeghị aka otu ọzọ akpọrọ Hakika gosiri ihu n'Adamawa nakwa Nasarawa Steeti.

Ndị ụkọchukwu Alakụba na-ekwu na mpụta ụdịrị otu ndị a, bụ nnukwute nsogbu nye Naịjirịa, ọkachasị ebe okwu Boko Haram ka dị ire.

BBC gbara ndị uweojii ajujụ maka ndị a, mana ha sị na ha amaghị maka ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ