Otu nwoke si Enugu-Agu egbuola nna ya n'Enugwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa

N'Enugu,

onye a kụrụ ịga

Ebe foto si, Getty Images

Ndi uweojii akparala otu nwoke gburu nna ya aka.

Ọnụ na-ekwuru uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu kwuru na Chibuike Nwachukwu ji obeji gbuo nna ya bụ Osita Nwachukwu n'ọnụ ụtụtụ taa n'Enugu-Agu Amuri dị na okpuru ọchịchị Nkanu West.

Onye Lebanon bu dọla ọkankụ adabala n'aka uweojii

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụ aka bụ EFCC nwụchịkọrọ otu nwoke onye Lebanon maka mpụ bekee kpóró "money laundering" n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikwe dị n'Abuja.

Nwoke a bu nde dọla, pounds, Euro, Riyal na ego ndị ọzọ ọkankụ o meghi ka gọọmenti mara maka ya aga Lebanon.

Onye a malitere njem na Kano. Cheta na "Money Laundering" bu mpụ.

Na Zamfara,

Boko Haram fighters

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ

Ndị uweojii ekwuola na ha gburu ndi oji egbe akpa ike karịrị otu nari na anọ .

Ihe mere n'obodo Birin-Magaji ụbọchị Tusde.

N'ofesi,

onye ọcha Sawụt Afịrịka

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe ukwu nke mba Sawụt Afịrịka atụpụla ikpe otu na-anọchite ndị ọcha nwere ala na mba ahụ wetere maka atumatu gọọmentị ha chọro iji napụ ha ala.

Gọọmenti onyeisiala Cyril Ramaphosa chọrọ ka ndị ọcha nye ndị isi oji ala na nkiti, makana ha si na ndi ọcha azụghị ala ahụ na mbụ, mana ndị ọcha si ka akwụọ ha ụgwo.

N'Egwuregwu,

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mmadụ ano si otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles nọ na ndi ahụpụtara na ndọrọndọrọ ituru ugo nke CAF na-enye kwa afọ.

Mmadụ anọ na Super Falcons na ndị nkuzi otu abụọ a sokwa na ndị nwere ike rite ihe.

Mberede ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na mmadụ ruru ise anwụọla n'ihe mberede mere n'ụzọ awarawa nke sị Enugu na-aga Abakiliki.

N'ime akụkọ ozi onye na-agbasa ozi ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Emma Amarizu zipuru ndị ntaakụkọ, ọ kọwara ihe mere oge otu ụgbọala Sienna chọrọ ịgbafe ụgbọala ọzọ na-aga n'iru ya.

Ọ bụ mgbe ahụ ka ya na ụgbọala ọzọ akpọrọ tipper na Bekee sụkọtọrọ isi.

Amarizu kwuru na ndị uweojii jiri ohere a arịọ ndị mmadụ ka ha nwetuo obi ma ha na-anya ụgbọala n'oge ekeresimesi a.

Okwu adaala maka ihe Lai Mohammed gwara ndị Amerika

Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Okwu dara ụzọ abụọ n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ maka ndụmọdụ Lai Mohammed bụ minista mgbasa ozi nyere gọọmentị Amerika ka ha sepuu aka n'inye Atiku Abubakar akwụkwọ ikike ịbata ala ha.

Ufọdụ ndị mmadụ na-ekwu na udi emume a na-egosi na Amerika na-akwado sọọsọ Atiku na ntuliaka a.

Mana ndị ọzọ na-ekwu na Naịjirịa enweghị ikike ịgwa Amerika onye ha ga-enye akwụkwọ ikike nke ala ha.

Onye ndụmọdụ onyeisi oche otu Peoples Democratic Party (PDP) bụ Ike Abonyi gwara BBC Igbo na ndị otu APC ekwesighi ị na-ekwe ka ihe gbasara onyeọzọ ị ga mba ofesi chuo ha ụra.

Kama ha gba mbọ hụ na ha doziri obodo Naịjirịa dịka ha si kwe na nkwa.

N'ofesi

Trump

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi, ọtụtụ ndị mba Amerika na-akatọ onyeisiala ala ha bụ Donald Trump maka akụkọ pụtara na onye bubu onye okwaiwu ya bụ Michael Cohen tụrụ asị oge ọ na-aza ajujụ n'aka ndị ụlọomeiwu nke ala ahụ.

Cohen zara ọtụtụ ajujụ maka ebubo ha na-ebo na ndị Rọshịa tinyere aka na ntuliaka Amerika mere na 2016.

N'egwuregwu

Ndị Arsenal

Ebe foto si, Reuters

N'egwuregwu, obi na-atọ ndị na-akwado otu Arsenal rịrịrị maka mmeri ha meri Vorskla Poltva ọkpụ atọ asatara ihe n'asọmpị Europa.

Cardiff na Wolves bụ ndị ga-ezute onwe ha taa na Premier league.

Gee nkeji anyị

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri taa

Aha onyonyo, Vicky Nwogu