Goodluck Jonathan: Obama 'tinyere ọnụ n'ihe agbasaghị ya' na ntuliaka 2015

Aha onyonyo, Goodluck Jonathan: Obama 'tinyere ọnụ n'ihe agbasaghị ya' na ntuliaka 2015

Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa kwuru na onye otu ya chịburu Amerịka bụ Barrack Obama, tinyere aka na ntuliaka 2015.

Jonathan kwuru na ọ bụ aka Amerịka tinyere mere ka ọ ghara ịzọta ọkwa onyeisiala ọzọ na 2015.

Oge ntuliaka ahụ ruru nso, Obama mere onyonyo ebe o gwara ndị Naịjirịa okwu, ma zite John Kerry bụ odeakwụkwọ kachasị nke Amerịka mgbe ahụ, ka ọ bịa Naịjiria maka ndọtị adọtịrị ntuliaka ahụ site Febrụwarị ruo Maachị maka okwu nchekwa dị oge ahụ.

Jonathan kwuputara nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere dịka Naịjirịa na-akwado maka ntuliaka na-abịa na Febrụwarị 2019.

O kwuru na ebe ekwesịghị ijide ya aka maka ntọ a tọrọ ụmụakwụkwọ 278 n'obodo Chibok, na ọ gaghị ewepụ onwe ya n'ụta maka etu ndị ọrụ nchekwa si daa mba ịgbapụta ha.

Ihe karịrị ụmụakwụkwọ 100 ka nọ n'agbụ ndị Boko Haram.

Akụkọ ga-amasị gị: