Atiku, Jonathan, Obasanjo, Buhari na ndị ọzọ kọrọ akụko ụbịam

Obasanjo,Jonathan,Buhari,Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụbịam abụghị ihe e ji eme ọnụ nke mere na ọtụtụ ndị mmadụ a mụrụ n'ihe isi ike anaghị ekwe akọta akụkọ ụwa ha.

Mana n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria, ụbịam bụ akụkọ e ji anya isi nke bụ n'ọtụtụ na-azọ ọkwa ọchịchị nwere otu akụkọ ụbịam maọbụ nke ọzọ ha na-akọ iji nweta obi ndị mmadụ.

Atiku Abubakar, bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP, gwara ụmụ Naijiria na ya bụ nwa enwe nne, enwe nna na-ere nkụ na Jada dị n'Adamawa oge ya bụ nwata.

Atiku kwuru nke a n'ụbochị Monde, dịka ọ na-ewepụta nkwa o kwere ụmụ Naijiria maka achụmnta vootu afọ 2019 nke ọ kpọọ #TheAtikuplan na bekee.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ka Atiku kwuru nke ya, lee ndi ọzọ kwuburu udiri ihe a mgbe ha na-agba nta vootu.

Olusegun Obasanjo

Olusegun Obasanjo

Ebe foto si, Getty Images

Onye Atiku soro rụọ ọrụ dịka onyeisiala n'afọ 1999 rue 2007 bụ Olusegun Obasanjo.

Ọ bụ onye mbụ chịrị Naijiria ngwa ngwa ọchịchị si n'aka ndị akwa kakị banye n'aka ndị agbada n'afọ 1999.

Ihe ndị nwere agba dịka Ayo Adebanjo nakwa Edwin Clark na-ebo bụ Obasanjobụ nwere naani puku naira iri abụọ (20,000) n'agbaego n'ụlọakụ oge ọ pụtachara ụlọmkpọọ ịbịa ịzọ ọchịchị n'afọ 1999.

Mana Obasanjo kwuru na na ya bụ onye ọrụugbo apụtaghị na ya bụ ogbenye.

Goodluck Jonathan

Goodluck Jonathan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jonathan: Enweghị m akpụkpọụkwụ oge m na-eto

Goodluck Jonathan, onye chịri Naijiria afọ isii kwuru na ya enweghị akpụkpọụkwụ oge ya na-etolite.

Oge o kwuputara ebumnobi ya ịzọ ọkwa ọchịchị n' Eagle Square dị n'Abuja, Jonathan sị," Oge m na-agụ akwụkwọ, enweghị akpụkpụkwụ, enweghị akpa akwụkwọ. Ana m achị akwụkwọ n'aka."

Muhammadu Buhari

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari: Ndị mmadu nyere aka zụta akwụkwọ mmasi ịzọ ọchịchị

Onyeisiala Muhammadu Buhari bụkwa onye zọọ ọkwa onyeisiala kọrọ akụkọ ma ọ bụghị onyeisiụlọakụ ya nakwa ndị ọzọ na ya agaghị iwe ike inwetanwu ego akwụkwọ mmasi ịzọ ọchịchị.

"N27 miilion bụ nnukwu ego. ekele dịị onyeisi ụlọakụ dị na Kaduna onye kpọọ oku gwa ya n'akwụkwọ mmasị apụta, ya zaa m emeghị etu a ohere ahụ efunahụ m."

Akụkọ ga-amasị gị