O nwere ihe ọhụrụ dị na nkwa next level Buhari kwere?

Oshiomhole,Aisha,Buhari na Osinbajo

Ebe foto si, @Bashir Ahmad

Kemgbe onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara nkwa ọhụrụ oge mere ụmụ Naijiria ma ahọpụta ya ọzọ ka ọ chịa, okwu akpụ n'ọnụ bụ "Next level.'

Nke a bụ aha ọ gụrụ akwụkwọ na-ekwuputa ebumnuche ya n'ebe ụmụ Naịiria nọ.

I lezie anya nke ọma, ndịiche dị na nkwa 'Next level' na 'Change' bụ nkwa ya na pati ya bụ APC kwere ụmụ Naijiria n'afọ 2015 bụ na naanị aha ha.

Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ ịgbanye mmanya ochie na ite mmanya ọhụrụ.

Isi okwu nkwa abụọ ahụ gbadoro ụkwụ na inye ọrụ, ọkụ latrik, ibu agha megide nrụrụaka na okwu nchekwa.

Na nkọwa ya, otu onye ọrụ na-eru n'okwu 'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Họn Chukwunonye Okereke gwara BBC na o nweghị ihe ọhụrụ dị na nkwa 'Next Level.'

"Ihe a dịka mmadụ iwepụta ihe e dere, ticha ya etum,wepụtara ndị Naijiria sịkwa ha gụọ."

Lee ụfọdụ ihe dị na nkwa 'Change' na 'Next level':

Nkwa 2015 vs Nkwa 2019

N'ezie, ọtụtụ nkwa Buhari kwere na 2015, o mezughị ya.

Iji maatụ n'ihe gbasara ọkụ latrik kama naanị megawat 7,000 ka ewepụtara n'ime 20,000 o kwere na nkwa.

Kama inweta ọrụ, ihe karịrị nde mmadụ itolu bụ ndị a chụrụ n'ọrụ.

Ọzọ bu nkwa ịrụ mahadum nka na ụzụ isii mana o rụbeghị ọbụladi otu.

N'okwu Okereke, ihe Buhari na APC kwesiri ị na-agwa ndị Naijiria ugbua bụ ihe ha mere n'ime nkwa ha kweburu na abụghị ihe ha ga-eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ