Nutrition: Ụdị nri i kwesiri inye nwa gị iji gbalahụ ọrịa erighị ezigbo nri

Ụmụaka agụrụ na-agụ

Ebe foto si, Getty Images

Ozi ndị Ministri na-ahụ maka mkpata na mmefu akụ na ịhazị obodo a kpọrọ Ministry of Budget and National Planning na-ekwu na ihe ruru ụmụaka nde abụọ na ụma na-arịa ọrịa erighi ezigbo nri.

Onyeisi ndị ụlọọrụa bụ Udoma Udoma kwuputara nke a.

Udoma sị na amaghị ihe tinyere ọgaranya na ogbenye n'ọrịa.

BBC ji tinye ọnụ na ya bụ okwu ịchọpụta ihe nne na nna kwesiri ịme iji chụpụ ya bụ ọrịa erighi ezigbo nri n'ụlọ ha.

Ọtụtụ mgbe ka nne na nna na-enye ụmụ ha nri bekee nke ha kpọrọ "noodles" na achịcha bekee nke a kpọrọ "biscuit' aghara aghara hapụ nri zuru oke ha ga-enye nwa ha.

Mkpụrụosisi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mkpụrụosisi na akwụkwọnri bụ ezigbo nri kacha mma

Onye ọkammụta mahadum National Open University of Nigeria bụ Florence Uchendu kwuru na "ọ ka mma ịnye ụmụ gị nrị be anyị dịka ji, akwa, akidi, agwa, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nrị na ihe ndị ọzọ karịa inye ha "noodles" na achịchịa bekee".

Erighị na-emetuta ma ọgaranya,ma ogbenye

Florence sịrị na "ọrịa erighị ezigbo nri dị na ọgaranya dịkwa n'ogbenye".

Ọ sịkwa na ihe kpatara nke a bụ na nne na nna na-agba mbọ ihu n' ego batara n'ezinaụlọ ha ma hapụ ilebanye anya na nri ụmụ ha na-eri.

Aha onyonyo, Nutrition: Oke ibu abụghị na ahụ dị nwa m

Nke a mere na o nweghịzị onye nwere ohere ilebe anya n'ezinaụlọ.

Ọ sịkwa na mgbe ụfọdụ ndị ọgara ya na-enye ụmụ ha nrị ekwesịghị dịka akwa eghere eghe bụ nke ka enye ha naanị abụba.

Ụmụaka dị otụ a nwere ike ibu ibu nke nwere ike ịba ha ahụ ma akpachaghị anya mezịa ka ha rịawa obara mgbeli elụ maọbụ ọrịa shụga mgbe ha kataturu ahụ.

Nne na nna ndị nwere ike ịna aṅụrị na ahụ dị nwa ha mgbe ha dị na nwata.

Ọ Ụchendụ sị ihe kpatara nke a "bụ nṅomi anyị na-eṅomị ndị ọcha na-agbanyeghị na anyị na ha abụghị otu."

Ọ sịkwa na na-ezie "ọ bụghị na nrị "ome n'elụ" ndị a ndị njọ, kama na ha abụghị ezigbo nrị nwata ga-eri buru. Ha bụ nrị mgbadoume eji eche ka nrị ghee".

Uchendu dụkwara nne na nna ọdụ ka ha gbaa mbọ wepụte oge siere ụmụ ha ezigbo nri iji nyere ha aka ito ma nweekwa ụbụrụ zuru oke.

Akụkọ ga-amasị gị