Tosyn Bucknor: Ihe ị kwesiri ima maka ọrịa ọbara nko

Tosyn Bucknor

Ebe foto si, Google

Nkọwa foto, Tupu ọ nwụọ, Tosyn Bucknor na-arụ ọrụ n'Inspiration FM.

Tosyn Bucknor bụ onye ntaakụkọ ama ọfụma na Naịjirịa, nke mere ọnwụ ya jiri bụrụ ihe ọha na ama ji akparịta ụka na sochal midia.

Akụkọ pụtara maka ọnwụ nwaanyị a kwuru na ọ bụ di ya hụrụ ozu ya mgbe ọ natara ọrụ n'abalị ụnyaahụ bụ ụbọchị 19 n'ime ọnwa Nọvemba 2018.

Nwanne ya nwaanyị bụ Funke Bucknor-Obrute dere na Facebook na ihe gburu nwanne ya nwaanyị bụ ọrịa ahụ Bekee kpọrọ Sickle Cell.

Ihe Funke Bucknor-Obrute dere na Facebook

Ebe foto si, Funke Bucknor-Obrute

Ndị mma Tosyn Bucknor ma ya ka onye na-agụ egwu kpọrọ onwe ya Contradiction, ma makwara ya dịka onye ntaakụkọ redio akpọrọ Area Mama.

Ka ọ bụ eziokwu na ọrịa ọbara nko na-arịa nwaanyị a, ọ na-agba mbọ n'ọrụ ya nakwa ime ihe banyere nka n'ụzụ.

Ọ dị afọ 37 mgbe ọ nara mụọ.

Gịnị bụ ọrịa a Bekee kpọrọ 'Sickle Cell'?

Dọkinta Mcginger Ibeneme kọwara BBC ihe bụ ọrịa Sickle Cell nke ọ sị na Igbo gboo na-akpọ ọbara nko, okponọbara maọbụ ọrịa ogbanje.

O sị na o so n'ime ọrịa ndị a na-enwete site n'aka nna na nne.

Lee ihe dị ọzọ ọ Dọkinta Ibeneme gwara anyị maka ọrịa a:

  • Ndị ọ na efe karịa bụ ndị oji na ndị sị mpaghara Asia.
  • Ọrịa a na-emetụta mmepụta ọkpụkpụ ọbara. Nke a bụ na ndị ọrịa dị n'ahụ na-emepụta ọkpụkpụ ọbara ahụ esighi ike.
  • Na nkọwa Ibeneme, di na nwunye nwere agbọ ọbara AS, ohere diri ka nwa ha nwete nke SS - bụ nke bu ọrịa ọgbanje a.
  • Yabụ na onye nwere agbọ ọbara AS bụ onye Bekee kpọrọ "Carrier", ka onye nwere nke SS bụ onye bu ọrịa.
  • Ndị nwere ọrịa na-arịa ọrịa ọfụma nke mere o ji dị mkpa ị na-enyocha ọfụma tupu nwoke na nwaanyi agawa n'ihu ịmụ nwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: