Lee mkpamkpa ọkụ kpara n'ahịa Nkwo Ngwa Aba

Ọkụ Ahịa Aba

Ọkụ gbara ahịa Nkwọ Ngwa dị n'Aba, Abịa steeti lara ego ruru nde kwuru nde naira, ma gbarie ọdọahịa karịrị iri asaa (70).

Akụkọ kwuru na ọkụ ọgbụgba ahụ nke bụ igwe na-enye ọkụ bekee kpọrọ generator butere ya gbara ọgbọ osisi nakwa ebe a na-ere ihe e ji arụ ụlọ.

Akụkọ ọzọ n'ekwukwa na ọkụ a sị na ọdụahịa otu nwaanyị na-esi nrị ahịa na-emenyụghị ọkụ ya nke ọma.

Mbọ BBC gbara ịnwete ndị ọrụ na-emenyụ ọkụ bụ Abia Steeti Fire Service lara n'efu.

Lee foto sị na ihe mberede ahụ:

Ọkụ ahịa Aba
Ọ́ka Nkwọ Ngwa